Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Zekaraya 1:1-21

1  N’ọnwa nke asatọ, n’afọ nke abụọ nke ọchịchị Darayọs,+ okwu Jehova ruru Zekaraya+ nwa Berekaya nwa Ido,+ bụ́ onye amụma, ntị, sị:  “Jehova wesoro ndị nna unu iwe, nke ukwuu.+  “Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “‘Lọghachikwutenụ m,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘m ga-alọghachikwute unu,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”’  “‘Unu adịla ka ndị nna unu+ bụ́ ndị ndị amụma oge mbụ ji olu dara ụda gwa,+ sị: “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Biko, sinụ n’ụzọ ọjọọ unu nakwa n’omume ọjọọ unu lọghachi.’’”+ “‘Ma ha egeghị ntị, ha aṅaghịkwa m ntị,’+ ka Jehova kwuru.  “‘Olee ebe nna unu hà nọ?+ Ndị amụma+ hà dịruru ndụ mgbe ebighị ebi?  Otú ọ dị, ọ̀ bụ na okwu m na ụkpụrụ m ndị m nyere ndị ohu m, bụ́ ndị amụma,+ n’iwu emezughị n’isi nna unu hà?’+ Ha wee lọghachi, sị: ‘Ihe Jehova bu n’obi ime anyị+ dị ka ụzọ anyị na omume anyị si dị, ọ bụ ya ka o mere anyị.’”+  N’abalị iri abụọ na anọ, n’ọnwa nke iri na otu, ya bụ, n’ọnwa Shibat, n’afọ nke abụọ nke ọchịchị Darayọs,+ okwu Jehova ruru Zekaraya+ nwa Berekaya nwa Ido,+ bụ́ onye amụma, ntị, sị:  “Ahụrụ m n’abalị, ma, lee! e nwere otu nwoke+ nke nọ na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara,+ o guzokwa otu ebe n’etiti osisi metụl+ ndị dị n’ebe dịmiri adịmi; n’azụ ya kwa, e nwere ịnyịnya ndị na-acha uhie uhie, ndị na-acha nnọọ ọbara ọbara nakwa ndị na-acha ọcha.”+  M wee sị: “Onyenwe m, olee ndị bụ ndị a?”+ Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu+ wee sị m: “M ga-agwa gị ndị ha bụ.” 10  Nwoke ahụ nke guzo otu ebe n’etiti osisi metụl wee sị: “Ha bụ ndị Jehova zipụrụ ijegharị n’elu ụwa.”+ 11  Ha wee gwa mmụọ ozi Jehova nke guzo otu ebe n’etiti osisi metụl ahụ, sị: “Anyị ejegharịwo n’elu ụwa,+ ma, lee! ụwa dum dị jụụ n’enweghị nsogbu.”+ 12  Mmụọ ozi Jehova wee sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, olee mgbe ị ga-anọru tupu i meere Jeruselem na obodo ndị dị na Juda ebere,+ bụ́ ndị ị jụrụ kemgbe afọ iri asaa a?”+ 13  Jehova wee gwa mmụọ ozi ahụ nke nọ na-agwa m okwu okwu. Ọ gwara ya okwu ndị dị mma, ndị na-enye nkasi obi;+ 14  mmụọ ozi ahụ nke nọ na-agwa m okwu wee gaa n’ihu ịsị m: “Jiri olu dara ụda kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Ana m ekwosiri Jeruselem na Zayọn ekworo ike.+ 15  M na-eweso mba ndị tụsaara ahụ́+ oké iwe; n’ihi na mụ onwe m wetụrụ iwe,+ ma ha onwe ha so kpata ọdachi ahụ.”’+ 16  “N’ihi ya, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘“M ga-eji obi ebere lọghachikwute Jeruselem.+ A ga-ewu ụlọ m n’ime ya,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “a ga-esetịkwa eriri e ji atụ̀ ihe n’elu Jeruselem.”’+ 17  “Jiri olu dara ụda kwuo ọzọ, sị ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Obodo m dị iche iche ga-ejupụta n’ịdị mma;+ Jehova ga-agbanwekwa obi ya n’ihi Zayọn,+ họrọkwa Jeruselem.”’”+ 18  M wee lelie anya hụ; ma, lee! e nwere mpi+ anọ. 19  M wee jụọ mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu, sị: “Gịnị bụ ihe ndị a?” O wee zaa m, sị: “Ha bụ mpi mere ka ndị Juda,+ Izrel+ na Jeruselem+ gbasasịa.” 20  Jehova gosikwara m ndị omenkà anọ. 21  M wee jụọ, sị: “Gịnị ka ndị a na-abịa ime?” O wee sị m: “Ha bụ mpi+ mere ka ndị Juda gbasasịa, nke na ọ dịghị onye ọ bụla weliri isi ya elu; ndị nke ọzọ a ga-abịakwa ka ha wee mee ka ha maa jijiji, ka ha wee tipịa mpi nke mba dị iche iche, bụ́ ndị na-ebuli mpi ha elu imegide ala Juda, iji mee ka ha gbasasịa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji