Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 99:1-9

99  Jehova aghọwo eze.+ Ka ndị dị iche iche maa jijiji.+ Ọ nọ ọdụ n’elu cherọb.+ Ka ụwa maa jijiji.+   Jehova dị ukwuu na Zayọn,+ Ọ dị elu karịa ndị niile dị iche iche.+   Ka ha too aha gị.+ Ọ dị ukwuu, bụrụkwa ihe a na-atụ egwu, ọ dịkwa nsọ.+   Ọ bụ eze nke na-eji ike ya egosi na ya hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.+ Gị onwe gị emewo ka ịkwụwa aka ọtọ guzosie ike.+ I mewo ka e nwee ikpe ziri ezi na ezi omume n’ime Jekọb.+   Toonụ Jehova Chineke anyị,+ kpọọkwanụ isiala n’ebe mgbakwasị ụkwụ ya;+ Ya onwe ya dị nsọ.+   Mozis na Erọn so ná ndị nchụàjà ya,+ Samuel sokwa ná ndị na-akpọku aha ya.+ Ha nọ na-akpọku Jehova, ya onwe ya nọkwa na-aza ha.+   Ọ nọ na-agwa ha okwu n’ogidi ígwé ojii.+ Ha debere ihe ncheta ya nakwa ụkpụrụ o nyere ha.+   Jehova Chineke anyị, gị onwe gị zara ha.+ Ị bụụrụ ha Chineke nke na-agbaghara mmehie,+ Nke na-abọkwa ọbọ n’ahụ́ ha maka arụ niile ha mere.+   Toonụ Jehova Chineke anyị,+ K p ọ ọ k w a n ụ isiala n’ugwu nsọ ya.+ N’ihi na Jehova Chineke anyị dị nsọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji