Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 98:1-9

Abụ olu ụtọ. 98  Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ,+ N’ihi na ihe ndị o mere dị ebube.+ Aka nri ya, ya bụ, ogwe aka ya nke dị nsọ, enwetaworo ya nzọpụta.+   Jehova emewo ka a mara nzọpụta ya;+ O kpughewo ezi omume ya n’anya mba dị iche iche.+   O chetawo obiọma* ya na ikwesị ntụkwasị obi ya n’ebe ụlọ Izrel nọ.+ Nsọtụ niile nke ụwa ahụwo nzọpụta si n’aka Chineke anyị.+   Tikuonụ Jehova mkpu mmeri, unu ndị niile bi n’ụwa.+ Nweenụ obi ụtọ, tienụ mkpu ọṅụ, bụọkwanụ abụ olu ụtọ.+   Jirinụ ụbọ akwara bụkuo Jehova abụ olu ụtọ,+ Jirinụ ụbọ akwara na abụ olu ụtọ bụkuo ya abụ.+   Jirinụ opi na ụda opi+ Tie mkpu mmeri n’ihu Eze, bụ́ Jehova.   Ka oké osimiri bigbọọ, ya na ihe jupụtara n’ime ya,+ Ma elu ala ma ndị bi n’ime ya.+   Ka osimiri kụọ aka; Ka ugwu niile tie mkpu ọṅụ+   N’ihu Jehova, n’ihi na ọ bịawo ikpe ụwa ikpe.+ Ọ ga-ekpe elu ala ikpe n’ezi omume,+ Kpeekwa ndị dị iche iche ikpe ziri ezi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 98:3*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”