Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 97:1-12

97  Jehova aghọwo eze!+ Ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.+ Ka agwaetiti niile ṅụrịa ọṅụ.+   Ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbara ya gburugburu;+ Ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze ya.+   Ọkụ na-aga n’ihu ya,+ Ọ na-erepịakwa ndị niile na-emegide ya, bụ́ ndị gbara ya gburugburu.+   Àmụ̀mà ya mere ka ìhè dị n’elu ala;+ Ụwa hụrụ ya wee nọrọ n’oké ihe mgbu.+   Ugwu dị iche iche gbazekwara dị ka mgbá aṅụ n’ihi Jehova,+ N’ihi Onyenwe ụwa dum.+   Eluigwe ekwupụtawo ezi omume ya,+ Ndị niile dị iche iche ahụwokwa ebube ya.+   Ka ihere mee ndị niile na-efe ihe oyiyi ọ bụla a pịrị apị ofufe,+ Ndị ji chi na-abaghị uru na-anya isi.+ Kpọọrọnụ ya isiala, unu chi niile.+   Jehova, Zayọn nụrụ mmeri i nwere wee malite ịṅụrị ọṅụ,+ Obodo nta ndị dị na Juda malitekwara inwe obi ụtọ,+ N’ihi mkpebi ikpe gị.+   N’ihi na gị onwe gị, Jehova, bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile;+ Ị rịgowo n’ebe dị nnọọ elu wee karịa chi niile ọzọ.+ 10  Unu ndị hụrụ Jehova n’anya,+ kpọọnụ ihe ọjọọ asị.+ Ọ na-eche mkpụrụ obi nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche;+ Ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.+ 11  Ìhè enwuworo onye ezi omume,+ Ịṅụrị ọṅụ abịawokwara ndị obi ha ziri ezi.+ 12  Ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova, unu ndị ezi omume,+ Nyenụ aha nsọ ya ekele.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji