Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 95:1-11

95  Bịanụ ka anyị tikuo Jehova mkpu ọṅụ!+ Ka anyị tikuo Oké Nkume nke nzọpụta anyị mkpu mmeri.+   Ka anyị jiri ekele bịa n’ihu ya;+ Ka anyị jiri abụ olu ụtọ tikuo ya mkpu mmeri.+   N’ihi na Jehova bụ Chineke dị ukwuu,+ Bụrụkwa Eze dị ukwuu karịa chi ọzọ niile,+   Onye ebe kasị mie emi n’ụwa dị n’aka,+ Onye nwekwa elu elu ugwu;+   Onye nwe oké osimiri, nke ya onwe ya kere,+ Onye aka ya kere ala akọrọ.+   Batanụ, ka anyị fee ya ofufe kpọọrọ ya isiala;+ Ka anyị gbuo ikpere n’ala+ n’ihu Jehova bụ́ Onye kere anyị.+   N’ihi na ya onwe ya bụ Chineke anyị, anyị bụ ndị ọ na-azụ n’ebe ịta nri ya, bụrụkwa atụrụ ndị aka ya na-elekọta.+ Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+   Unu akpọchila obi unu dị ka nna nna unu hà kpọchiri na Meriba,+ Dị ka ha mere n’ụbọchị ha nọ na Masa nke dị n’ala ịkpa,+   Mgbe nna nna unu hà nwara m ọnwụnwa;+ Ha lere m ule, ha hụkwara ihe m mere.+ 10  Akpọrọ m ọgbọ ahụ asị ruo afọ iri anọ,+ M wee sị: “Ha bụ ndị na-akpafu akpafu n’obi ha,+ Ha onwe ha amaghịkwa ụzọ m”;+ 11  Bụ́ ndị m ji iwe ṅụọ iyi banyere ha, sị:+ “Ha agaghị abanye n’ebe izu ike m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji