Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 92:1-15

Abụ olu ụtọ, abụ a na-abụ n’ụbọchị izu ike. 92  Ọ dị mma ikele Jehova ekele+ Na ịbụku aha gị abụ olu ụtọ, gị Onye Kasị Elu;+   Ịkọ banyere obiọma* gị n’ụtụtụ+ Nakwa ịkọ banyere ikwesị ntụkwasị obi gị n’abalị,+   Jiri une na ụbọ nwere akwara iri na-akọ banyere ya,+ Jiri egwú na-ada ụda nke e ji ụbọ akwara na-akpọ na-akọ banyere ya.+   N’ihi na gị onwe gị, Jehova, emewo ka m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi ọrụ gị; M na-eti mkpu ọṅụ n’ihi ọrụ aka gị.+   Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Jehova!+ Echiche gị miri emi nke ukwuu.+   Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-adịghị eche echiche nke pụrụ ịmata ha,+ Ọ dịghịkwa onye nzuzu nke pụrụ ịghọta ya.+   Mgbe ndị ajọ omume pulitere dị ka ahịhịa ndụ,+ Ndị niile na-eme ihe ọjọọ ana-amakwa pokopoko, Ọ bụ ka e wee laa ha n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.+   Ma gị onwe gị, Jehova, nọ n’elu ruo mgbe ebighị ebi.+   N’ihi na, lee! ndị iro gị ga-ala n’iyi, Jehova,+ N’ihi na, lee! ndị iro gị ga-ala n’iyi;+ A ga-achụsasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ.+ 10  Ma ị ga-eme ka mpi m dị elu dị ka nke atụ́;+ M ga-ete mmanụ ọhụrụ.+ 11  M ga na-ele ndị iro m anya, na-achị ha ọchị;+ Ntị m ga na-anụ banyere ndị na-ebili imegide m, bụ́ ndị na-eme ihe ọjọọ. 12  Onye ezi omume ga na-eto na-ebu dị ka nkwụ;+ Ọ ga-agba agba dị ka osisi sida nke dị na Lebanọn.+ 13  Ndị a kụrụ n’ụlọ Jehova,+ N’ogige ụlọ Chineke anyị,+ ga na-ama pokopoko. 14  Ha ka ga na-eme nke ọma n’isi awọ́ ha,+ Ha ka ga-agba agba, na-amakwa pokopoko,+ 15  Ka ha wee na-akọ na Jehova bụ onye ezi omume.+ Ọ bụ Oké Nkume m,+ onye na-adịghị eme ajọ omume.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 92:2*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”