Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 79:1-13

Abụ olu ụtọ Esaf. 79  Chineke, ndị mba ọzọ abatawo n’ihe nketa gị;+ Ha emerụwo ụlọ nsọ gị;+ Ha emewo ka Jeruselem bụrụ mkpọmkpọ ebe.+   Ha emewo ka ozu ndị ohu gị ghọọrọ nnụnụ nke eluigwe ihe oriri,+ Werekwa anụ ahụ́ nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ nye anụ ọhịa nke ụwa.+   Ha awụpụwo ọbara ha dị ka mmiri Na Jeruselem dum, ọ dịghịkwa onye ga-eli ha.+   Anyị aghọworo ndị agbata obi anyị ihe nkọcha,+ Ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ọchị na ihe ịkwa emo.+   Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga na-ewe oké iwe? Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?+ Ruo ole mgbe ka iwe gị ga na-enwu dị ka ọkụ?+   Wụkwasị mba ndị na-amaghị gị ọnụma gị,+ Wụkwasịkwa alaeze ndị na-adịghị akpọku aha gị ọnụma gị.+   N’ihi na ha eripịawo Jekọb,+ Ha emewokwa ka ebe obibi ya tọgbọrọ n’efu.+   Echetala njehie nna nna anyị hà wee taa anyị ahụhụ n’ihi ya.+ Meere anyị ebere ọsọ ọsọ,+ N’ihi na ike agwụla anyị kpamkpam.+   Nyere anyị aka, Chineke nke nzọpụta anyị,+ N’ihi ebube nke aha gị;+ Napụta anyị, kpuchiekwa mmehie anyị n’ihi aha gị.+ 10  Gịnị mere mba dị iche iche ga-eji sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”+ Ka anyị hụ mgbe a ga-eme ka a mara n’etiti mba niile+ Ọbọ ị ga-abọ maka ọbara ndị ohu gị a wụfuru.+ 11  Ka ị nụ ude onye mkpọrọ na-asụ.+ Dị ka ogwe aka gị si dị ukwuu, chebe ndị a mara ikpe ọnwụ.+ 12  Jehova, kwụọ ndị agbata obi anyị ụgwọ nkọcha ha kọchara gị,+ Kwụọ ha ụgwọ okpukpu asaa, wụnye ya n’obi uwe ha.+ 13  Anyị bụ́ ndị gị na ìgwè atụrụ nke nọ n’ebe ịta nri gị,+ Ga na-ekele gị ruo mgbe ebighị ebi; Anyị ga-akọ otuto gị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji