Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 77:1-20

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Jedutọn. Abụ ọma Esaf.+ Abụ olu ụtọ. 77  M ga-eji olu m tikuo Chineke,+ M ga-eji olu m tikuo Chineke, ọ ga-egekwa m ntị.+   Achọrọ m Jehova n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ.+ Agbatịwo m aka n’abalị, ọ kụnwụghịkwa akụnwụ; Mkpụrụ obi m ekweghị ka a kasie ya obi.+   M ga-echeta Chineke, obi agaghịkwa ezu m ike;+ M ga-echegbu onwe m, ike ga-agwụkwa mmụọ m.+ Sila.   I jidewo mbubere anya m;+ Ahụ́ erughị m ala, apụghịkwa m ikwu okwu.+   Echebarawo m oge dị anya gara aga echiche,+ Chebarakwa afọ ndị a na-amaghị ama gara aga echiche.   Aga m echeta egwú m ji ụbọ akwara na-akpọ n’abalị;+ M ga-echegbu onwe m n’ime obi m,+ M ga-eji mmụọ m tụgharịa uche nke ọma.   Jehova ọ̀ ga-ajụ anyị ruo mgbe ebighị ebi,+ Ọ̀ bụ na ihe anyị agakwaghị amasị ya ọzọ?+   Obiọma* ya ọ̀ kwụsịwo ruo mgbe ebighị ebi?+ Okwu ya ọ̀ ghọọla ihe efu+ site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ?   Chineke ò chefuwo ime amara,+ Ka ò jiriwo iwe kwụsị ime ebere ya?+ Sila. 10  M̀ ga-asị: “Ọ bụ ihe a bụ ihe na-amapu m afọ,+ Onye Kasị Elu agbanwewo otú o si eji aka nri ya emeso anyị”?+ 11  M ga-echeta ihe niile Jaa mere;+ N’ihi na m ga-echeta ihe dị ịtụnanya i mere n’oge dị anya gara aga.+ 12  M ga-atụgharị uche n’ọrụ gị dum,+ M ga na-echebara ihe niile i mere echiche.+ 13  Chineke, ụzọ gị dị n’ebe nsọ.+ Ònye bụ Chi ukwu dị ka Chineke?+ 14  Ọ bụ gị bụ ezi Chineke, onye na-eme ihe dị ebube.+ I mewo ka a mata ike gị n’etiti ndị dị iche iche.+ 15  I jiriwo ogwe aka gị gbapụta ndị gị,+ Bụ́ ụmụ Jekọb na ụmụ Josef. Sila. 16  Mmiri ahụwo gị, Chineke, Mmiri ahụwo gị; o wee malite inwe oké ihe mgbu.+ Ogbu mmiri dị iche iche malitekwara ime mkpatụ.+ 17  Mmiri esiwo n’ígwé ojii zosie ike;+ Ígwé ojii emewo mkpọtụ. Akụ́ gị wee na-aga aghara aghara.+ 18  Ụda égbè eluigwe gị dị ka ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya;+ Àmụ̀mà emewo ka ìhè dị n’elu ala;+ Ụwa mere mkpatụ, malitekwa ịma jijiji.+ 19  Ụzọ gafere n’etiti oké osimiri,+ Ụzọ gị gafekwara n’etiti ọtụtụ mmiri; A matabeghịkwa nzọụkwụ gị. 20  I si n’aka Mozis na Erọn+ Duo ndị gị dị nnọọ ka ìgwè ewu na atụrụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 77:8*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”