Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 70:1-5

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid, nke e ji echeta ihe.+ 70  Chineke, biko bịa ngwa ngwa napụta m,+ Jehova, biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+   Ka ihere mee ndị na-achọ mkpụrụ obi m, ka e mechuokwa ha ihu.+ Ka ndị ọdachi m na-atọ ụtọ laghachi azụ, ka e menyekwa ha ihere.+   Ka ha laghachi azụ n’ihi ihere na-eme ha, bụ́ ndị na-asị: “Ntọọ, ntọọ!”+   Ka ndị niile na-achọ gị nwee obi ụtọ ma ṅụrịa ọṅụ n’ime gị,+ Ka ndị hụrụ nzọpụta gị n’anya na-ekwu mgbe niile, sị: “Ka e too Chineke!”+   Ma anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye.+ Chineke, biko, mee ihe ngwa ngwa n’ihi m.+ Ị bụ onye na-enyere m aka na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.+ Jehova, biko, egbula oge.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji