Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 61:1-8

Ntụziaka e nyere onye nduzi ụbọ akwara. Abụ ọma Devid. 61  Chineke, biko, nụrụ ákwá m na-ebesara gị.+ Ṅaa ntị n’ekpere m.+   M ga-esi na nsọtụ ụwa tikuo gị, mgbe obi m dara mbà.+ Duru m ka m rịgoro n’elu oké nkume nke dị elu karịa m.+   N’ihi na ị bụụrụ m ebe mgbaba,+ Bụkwaara m ụlọ elu siri ike n’ihu onye iro.+   M ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị ruo mgbe ebighị ebi;+ M ga-agbaba n’okpuru nku gị.+ Sila.   N’ihi na gị onwe gị, Chineke, egewo ntị ná nkwa m kwere.+ I nyewo m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.+   Ị ga-eme ka ụbọchị eze dịkwuo ogologo;+ Ọ ga-adị ogologo ndụ dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+   Ọ ga-ebi n’ihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;+ Biko, zite obiọma* na eziokwu, ka ha wee chebe ya.+   N’ihi ya m ga na-abụku aha gị abụ olu ụtọ ruo mgbe ebighị ebi,+ Ka m wee na-emezu nkwa m kwa ụbọchị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 61:7*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”