Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 60:1-12

Ntụziaka e nyere onye nduzi Okooko Lili nke Ihe Ncheta. Miktam. Abụ ọma Devid. Maka ịkụzi ihe.+ Mgbe ya na Eram-nehareyim na Eram-Zoba lụrụ ọgụ, Joab wee laghachi gbuo ndị Idọm dị puku mmadụ iri na abụọ na Ndagwurugwu Nnu.+ 60  Chineke, ị jụwo anyị, ị wakpowo anyị,+ I wewo iwe. Nabataghachi anyị.+   I mewo ka ala maa jijiji, i mewo ka ọ gbawaa.+ Mechie oghere ya niile, n’ihi na ọ mawo jijiji.+   I mewo ka ndị gị nwee ihe isi ike.+ I mewo ka anyị ṅụọ mmanya, anyị wee na-adagharị.+   I nyewo ndị na-atụ egwu gị ihe mgbaàmà+ Ka ha na-agba rịgọ rịgọ ka a ghara ịgbata ha ụta. Sila.   Ka e wee napụta ndị ị hụrụ n’anya,+ Biko, jiri aka nri gị zọpụta anyị ma za anyị.+   Chineke ekwuwo okwu n’ịdị nsọ ya, sị:+ “M ga-aṅụrị ọṅụ, m ga-ewere Shikem nye ndị m ka ọ bụrụ ihe nketa ha;+ M ga-atụkwa ndagwurugwu Sọkọt atụ̀ nyefee ndị m.+   Ọ bụ m nwe Gilied, ọ bụkwa m nwe Manase,+ Ifrem bụkwa ebe e wusiri ike nke onye m mere onyeisi; Juda bụ mkpara nke onye m mere onye na-achị achị.+   Moab bụ ite m ji asa ihe.+ M ga-atụba akpụkpọ ụkwụ m n’Idọm.+ M ga-eti mkpu mmeri n’isi Filistia.”+   Ònye ga-akpọga m n’obodo ahụ a nọchibidoro n’agha?+ Ònye ga-eduru m ruo Idọm?+ 10  Ọ́ bụghị gị, Chineke, bụ́ onye jụrụ anyị,+ Onye na-adịghịkwa eso ndị agha anyị eje agha dị ka Chineke?+ 11  Nyere anyị aka ka anyị pụta n’ahụhụ,+ N’ihi na nzọpụta nke si n’aka mmadụ abaghị uru.+ 12  Anyị ga-enweta ike site n’enyemaka Chineke,+ Ya onwe ya ga-azọdakwa ndị na-emegide anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji