Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 59:1-17

Ntụziaka e nyere onye nduzi. “Alala m n’iyi.” Abụ ọma Devid. Miktam. Mgbe Sọl dunyere ndị mmadụ, ha wee gaa na-eche ụlọ Devid nche, ka ha gbuo ya.+ 59  Chineke m, biko, napụta m n’aka ndị iro m;+ Chebe m ka m ghara ịdaba n’aka ndị na-ebili imegide m.+   Napụta m n’aka ndị na-eme ihe ọjọọ,+ Zọpụtakwa m n’aka ndị ikpe ọbara mara.   N’ihi na, lee! ha echebiriwo mkpụrụ obi m;+ Jehova, ndị dị ike na-awakpo m,+ Mgbe ọ na-adịghị isi m nupụrụ, mgbe ọ na-adịghịkwa mmehie m mere.+   Ọ bụ ezie na ejehieghị m, ha na-eji ọsọ gaa jikere.+ Mgbe m kpọkuru gị, bilie hụrụ.+   Gị onwe gị, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ Chineke Izrel.+ Teta chee ihu gị n’ebe mba niile nọ.+ Emerela ndị ọjọọ ọ bụla na-arara mmadụ nye amara.+ Sila.   Ha na-alaghachite n’oge anyasị;+ Ha na-agbọ ụja dị ka nkịta+ ma na-agagharị n’obodo.+   Lee! Ha na-agbọpụtasị okwu ọjọọ n’ọnụ ha;+ Mma agha dị n’egbugbere ọnụ ha,+ N’ihi na ha na-asị: “Ònye na-ege ntị?”+   Ma gị onwe gị, Jehova, ga-achị ha ọchị;+ Ị ga-akwa mba niile emo.+   Ike m, n’ebe ị nọ ka anya m ga-adị;+ N’ihi na Chineke bụ ebe m dị elu e wusiri ike.+ 10  Chineke nke na-egosi m obiọma* ga-ezute m;+ Chineke ga-eme ka m na-ele ndị iro m anya, na-achị ha ọchị.+ 11  Egbula ha, ka ndị m wee ghara ichefu.+ Jehova bụ́ ọta anyị, biko, jiri ike gị mee ka ha wagharịa,+ Kwada ha,+ 12  N’ihi mmehie ha ji ọnụ ha mee, bụ́ okwu nke si n’egbugbere ọnụ ha;+ Ka e jidekwa ha na nganga ha,+ Ee, n’ihi ọbụbụ ọnụ na okwu aghụghọ ha na-ekwu ugboro ugboro. 13  Jiri ọnụma gị laa ha n’iyi;+ Laa ha n’iyi, ka ha ghara ịdịkwa; Ka ha wee mara na ọ bụ Chineke na-achị n’ime Jekọb ruo na nsọtụ ụwa.+ Sila. 14  Ka ha laghachite n’oge anyasị; Ka ha gbọọ ụja dị ka nkịta ma gagharịa n’obodo.+ 15  Ka ha wagharịa chọọ ihe ha ga-eri;+ Ka afọ ghara iju ha, ka ha gharakwa ịhụ ebe ha ga-ehi ụra abalị.+ 16  Ma mụ onwe m ga-abụ abụ banyere ike gị,+ M ga-ejikwa ọṅụ kọọ banyere obiọma gị n’ụtụtụ.+ N’ihi na ị bụụrụ m ebe dị elu e wusiri ike+ Nakwa ebe m ga-agbaba n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ.+ 17  Ike m, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ olu ụtọ,+ N’ihi na Chineke bụ ebe m dị elu e wusiri ike, bụrụkwa Chineke nke na-egosi m obiọma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 59:10*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”