Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 58:1-11

Ntụziaka e nyere onye nduzi. “Alala m n’iyi.” Abụ ọma Devid. Miktam. 58  Ebe unu gbachiri nkịtị, ùnu pụrụ ikwu okwu banyere ezi omume?+ Ùnu pụrụ ikpe ikpe ziri ezi, unu ụmụ mmadụ?+   Ee e, kama lee otú unu si jiri obi unu dum na-eme ihe doro anya na ọ bụ ajọ omume n’ụwa,+ Na-edozikwa ụzọ maka ihe ọjọọ unu na-eme!+   Ndị ajọ omume si n’afọ bụrụ ndị arụ;+ Ha si n’afọ kpafuwe; Ha na-ekwu okwu ụgha.+   Elò ha yiri elò agwọ,+ Ha na-akpọchi ntị dị ka agwọ ubí nke mechiri ntị ya,+   Nke na-agaghị anụ olu ndị na-ara ya ụrà,+ Ọ bụrụgodị na onye maara ihe ejiri ọgwụ jide ya.+   Chineke, biko, kụpụsịa ha ezé n’ọnụ.+ Jehova, biko, kụkapụ ọkpụkpụ agba ụmụ ọdụm tojuru etoju.   Ka ha sọrọ pụọ dị ka mmiri na-asọpụ asọpụ;+ Ka o kwee ụta ọ ga-eji gbaa akụ́ ka ha nọ na-ada.+   Ha na-aga ije dị ka eju nke na-achọ ịnwụ anwụ;* Dị ka ime nke pụrụ nwaanyị, ha agaghị ahụ anyanwụ.+   Tupu ọkụ osisi ogwu unu sonyere n’ọkụ emetụ ite unu,+ Ọ ga-ebufu ma osisi ogwu nke dị ndụ ma nke e sonyere n’ọkụ dị ka oké ifufe.+ 10  Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ọ hụwo ọbọ a bọrọ.+ Ọ ga-eji ọbara onye ajọ omume saa ụkwụ ya.+ 11  Mmadụ ga-asịkwa:+ “N’ezie, onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ.+ N’ezie, e nwere Chineke nke na-ekpe ikpe n’ụwa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 58:8*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “na-agbaze agbaze.”