Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 52:1-9

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Maskil. Abụ ọma Devid, mgbe Doeg onye Idọm bịara kọọrọ Sọl na Devid bịara n’ụlọ Ahimelek.+ 52  Gịnị mere i ji were ihe ọjọọ na-etu ọnụ, gị onye dị ike?+ Obiọma* Chineke na-adịru ogologo ụbọchị dum.+   Ire gị na-akpa nkata ihe ọjọọ, ị mụwo ya dị ka agụba,+ Ọ na-aghọ aghụghọ.+   Ị hụrụ ihe ọjọọ n’anya karịa ihe ọma,+ Ị hụkwara okwu ụgha n’anya karịa ikwu eziokwu.+ Sila.   Ị hụrụ okwu niile na-emebi ihe n’anya,+ Gị ire aghụghọ.+   Chineke ga-adọtukwa gị ruo mgbe ebighị ebi;+ Ọ ga-akụtu gị ma si n’ụlọikwuu gị dọkapụ gị,+ Ọ ghaghịkwa ifopụ gị n’ala ndị dị ndụ.+ Sila.   Ndị ezi omume ga-ahụ ya wee tụọ egwu,+ Ha ga-achịkwa ya ọchị.+   Onye a bụ dimkpa nke na-adịghị eme Chineke ebe ya e wusiri ike,+ Kama ọ tụkwasịrị obi n’akụ̀ ya dị ukwuu,+ Nke na-achọ iji ahụhụ ọ na-akpata mere ihe nchebe.+   Ma m ga na-ama pokopoko n’ụlọ Chineke dị ka osisi oliv;+ Atụkwasịrị m obi n’obiọma Chineke ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+   M ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na i mewo ihe;+ M ga-enwekwa olileanya n’aha gị n’ihu ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ n’ihi na ọ dị mma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 52:1*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”