Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 5:1-12

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi Nihilọt. Abụ olu ụtọ Devid. 5  Jehova, biko, nụrụ ihe m na-ekwu;+ Ghọta ịsụ ude m.   Eze m+ na Chineke m, biko, ṅaa ntị ná mkpu enyemaka m na-eti,+ n’ihi na ọ bụ gị ka m na-ekpeku ekpere.+   Jehova, biko, nụrụ olu m n’ụtụtụ;+ M ga-agwa gị okwu n’ụtụtụ ma chere.+   N’ihi na ị bụghị Chineke nke ajọ omume na-atọ ụtọ;+ Onye ọjọọ agaghị ebinyere gị ma ọlị.+   Ndị na-etu ọnụ agaghị eguzo n’ihu gị.+ Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị;+   Ị ga-ebibi ndị na-ekwu okwu ụgha.+ Jehova kpọrọ onye na-awụfu ọbara+ na onye na-aghọ aghụghọ+ asị.   Ma mụ onwe m, n’ihi obiọma* gị dị ukwuu,+ M ga-abata n’ụlọ gị,+ M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala n’ihi egwu m na-atụ gị.+   Jehova, biko, duo m n’ezi omume+ gị n’ihi na ndị iro gbara m gburugburu;+ Mee ka ụzọ gị dị larịị n’ihu m.+   N’ihi na ọ dịghị ihe si ha n’ọnụ a pụrụ ịtụkwasị obi;+ Ime afọ ha bụ nnọọ ahụhụ.+ Akpịrị ha bụ ili ghere oghe;+ Ire ụtọ ka ha ji ekwu okwu.+ 10  Chineke ga-ama ha ikpe;+ Atụmatụ ha ga-eme ka ha daa.+ Ka a chụsaa ha n’ihi na mmebi iwu ha dị ukwuu,+ N’ihi na ha nupụụrụ gị isi.+ 11  Ma ndị niile na-agbaba n’ime gị ga-aṅụrị ọṅụ;+ Ha ga na-eti mkpu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Ị ga-echebe ha, Ndị hụrụ aha gị n’anya ga-enwekwa aṅụrị n’ime gị.+ 12  N’ihi na gị onwe gị, Jehova, ga-agọzi onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume;+ Ị ga-eji ihu ọma gbaa ya gburugburu+ dị ka à ga-asị na ọ bụ ọta ukwu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 5:7*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”