Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 49:1-20

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma nke ụmụ Kora.+ Abụ olu ụtọ. 49  Nụrụnụ, unu ndị niile. Ṅaanụ ntị, unu ndị niile bi n’usoro ihe a,+   Unu ihe niile a kpọrọ mmadụ nakwa unu ụmụ mmadụ, Ma ọgaranya ma ogbenye.+   Ọnụ m ga-ekwu ihe amamihe dị na ya,+ Ihe m na-atụgharị n’uche ga-abụkwa ihe nghọta dị na ya.+   M ga-atọ ntị m n’ala ịnụrụ ilu;+ M ga-eji ụbọ akwara kọwaa ilu m.+   Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’ụbọchị ihe ọjọọ,+ Mgbe njehie nke ndị chọrọ ka m daa gbara m gburugburu?+   Ndị na-atụkwasị obi n’ihe onwunwe ha,+ Ndị na-anyakwa isi n’ihi na akụnụba ha dị ukwuu,+   Ọ dịghị otu n’ime ha pụrụ ịnapụta nwanne ya ma ọlị,+ Ọ dịghịkwa nke pụrụ inye Chineke ihe mgbapụta maka ya;   (Ihe mgbapụta a ga-akwụ maka mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ+ Nke na ọ dịghị adị ruo mgbe ebighị ebi)   Ka o wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ghara ịbanye n’olulu.+ 10  N’ihi na ọ na-ahụ na ọbụna ndị maara ihe na-anwụ,+ Ma onye nzuzu ma onye na-adịghị eche echiche na-ala n’iyi,+ Ha ga-ahapụkwara ndị ọzọ akụ̀ ha.+ 11  Ihe ha chọrọ bụ ka ụlọ ha dịruo mgbe ebighị ebi,+ Ka ụlọikwuu ha dịgidekwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+ Ha agụwo ala ha aha ha.+ 12  Ma mmadụ apụghị ịnọgide na-adị ndụ n’agbanyeghị na a na-asọpụrụ ya;+ O yiri nnọọ anụ ọhịa ndị e gburu egbu.+ 13  Nke a bụ ihe na-eme ndị dara iberiibe,+ Na ndị na-eṅomi ha, bụ́ ndị ọnụ ha na-etu na-atọ ụtọ. Sila. 14  Ha ga-aga Shiol dị ka atụrụ e du edu;+ Ọnwụ ga-edu ha dị ka atụrụ;+ Ndị ziri ezi ga-achị ha n’ụtụtụ,+ Ha ga-aka nká;+ Onye nke ọ bụla ga-aga Shiol, kama ịga n’ebe obibi dị elu.+ 15  Otú ọ dị, Chineke ga-anapụta mkpụrụ obi m n’aka Shiol,+ N’ihi na Ọ ga-anabata m. Sila. 16  Atụla egwu ma ọ bụrụ na mmadụ enweta akụnụba,+ Ma ọ bụrụ na ebube nke ụlọ ya adịkwuo ukwuu.+ 17  N’ihi na ọ pụghị iwere ihe ọ bụla ma ọlị mgbe ọ nwụrụ;+ Ebube ya agaghị eso ya gbadaa.+ 18  N’ihi na n’oge niile ọ dị ndụ, ọ nọ na-agọzi mkpụrụ obi ya;+ (Ndị mmadụ ga-eto gị n’ihi na ị na-eme nke ọma)+ 19  N’ikpeazụ, naanị ihe mkpụrụ obi ya na-eme bụ ịgakwuru ọgbọ nna nna ya hà.+ Ha agakwaghị ahụ ìhè.+ 20  Mmadụ nke na-adịghị aghọta ihe, n’agbanyeghị na a na-asọpụrụ ya,+ Yiri nnọọ anụ ọhịa ndị e gburu egbu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji