Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 48:1-14

Abụ. Abụ olu ụtọ nke ụmụ Kora.+ 48  Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye e kwesịrị ito nke ukwuu+ N’obodo Chineke anyị,+ n’ugwu nsọ ya.+   Ugwu Zayọn nke dị n’ime ime ebe ugwu,+ Bụ́ obodo nke Eze Ukwu,+ Mara mma n’ihi ịdị elu ya, bụrụkwa ihe aṅụrị nke ụwa dum.+   A marawo Chineke dị ka ebe dị elu e wusiri ike n’ime ụlọ elu ndị dị n’ime ya.+   N’ihi na, lee! ndị eze eyiwo agba wee zukọta,+ Ha niile agaferewo.+   Ha hụrụ ya; o wee ju ha anya. Ha mara jijiji wee gbalaga n’ihi ụjọ.+   Ụjọ jidere ha n’ebe ahụ,+ Ime mere ha dị ka nwaanyị na-amụ nwa.+   I ji ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mee ka ụgbọ mmiri niile nke Tashish kpuo.+   Dị nnọọ ka anyị nụrụ, otú ahụ ka anyị hụrụ ya+ N’obodo Jehova nke ụsụụ ndị agha, n’obodo Chineke anyị.+ Chineke ga-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.+ Sila.   Chineke, anyị echebarawo obiọma* gị echiche+ N’ime ụlọ nsọ gị.+ 10  Chineke, dị ka aha gị+ na-ede ude ruo na nsọtụ ụwa, otú ahụ ka otuto gị Na-eru nsọtụ ụwa. Aka nri gị jupụtara n’ezi omume.+ 11  Ka Ugwu Zayọn+ ṅụrịa ọṅụ, Ka obodo nta ndị dị na Juda nwee obi ụtọ,+ n’ihi mkpebi ikpe gị.+ 12  Gaanụ gburugburu Zayọn, gaakwanụ ya okirikiri,+ Gụọnụ ụlọ elu ya ọnụ.+ 13  Chebaranụ ékpè ya echiche.+ Leruonụ ụlọ elu ya niile anya, Ka unu wee kọọrọ ya ọgbọ dị n’ihu.+ 14  N’ihi na Chineke a bụ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Ya onwe ya ga na-edu anyị ruo mgbe anyị nwụrụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 48:9*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”