Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 43:1-5

43  Chineke, biko, kpee m ikpe,+ Kpechite ọnụ m+ n’ikpe mụ na mba nke na-adịghị eguzosi ike n’ihe nwere. Meere m ụzọ m ga-esi gbapụ n’aka onye aghụghọ nke bụkwa onye ajọ omume.+   N’ihi na ị bụ Chineke m, nke bụ́ ebe m e wusiri ike.+ Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ji na-ejegharị ná mwute n’ihi mmegbu si n’aka onye iro?+   Zipụ ìhè gị nakwa eziokwu gị.+ Ka ha na-edu m.+ Ka ha duru m rute n’ugwu nsọ gị nakwa n’ụlọikwuu gị dị ebube.+   M ga-abịakwa n’ebe ịchụàjà nke Chineke,+ Bịakwute Chineke, bụ́ oké ọṅụ m.+ M ga-ejikwa ụbọ akwara too gị, Chineke, bụ́ Chineke m.+   Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+ Gịnịkwa mere i ji na-agba ghara ghara n’ime m? Chere Chineke,+ N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu nakwa dị ka Chineke m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji