Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 41:1-13

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 41  Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe;+ Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi.+   Jehova ga-eche ya nche ma chebe ya ndụ.+ A ga-akpọ ya onye obi ụtọ n’ụwa;+ Ị pụghịkwa inyefe ya n’aka mkpụrụ obi ndị iro ya.+   Jehova ga-enye ya ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa;+ Ị ga-agbanwe ihe ndina ya dum n’oge ọ na-arịa ọrịa.+   Ma mụ onwe m sịrị: “Jehova, biko, meere m amara.+ Gwọọ mkpụrụ obi m, n’ihi na emehiewo m gị.”+   Ma ndị iro m na-ekwu ihe ọjọọ banyere m, sị:+ “Olee mgbe ọ ga-anwụ, aha ya ewee laa n’iyi?”   Ọ bụrụkwa na mmadụ abịa ịhụ m, ihe o bu n’obi bụ ịghara m ụgha;+ Ọ ga-achọta ihe ọjọọ; Ọ ga-apụ; ọ ga-anọ n’èzí na-ekwu ya.+   Ndị niile kpọrọ m asị na-agbakọ izu imegide m;+ Ha na-akpara m nkata ihe ọjọọ:+   “E mewo ka ihe na-abaghị n’ihe bịakwasị ya;+ Ugbu a o dinaworo ala, ọ gaghị ebili ọzọ.”+   Onye mụ na ya dịkwa ná mma, onye m tụkwasịrị obi,+ Onye na-eri nri m,+ atụgharịwo* megide m.+ 10  Ma gị onwe gị, Jehova, biko, meere m amara ma mee ka m bilie ọtọ,+ Ka m wee kwụghachi ha.+ 11  Eji m nke a mara na ihe m masịrị gị, N’ihi na onye iro m adịghị eti mkpu ọṅụ na ya emeriwo m.+ 12  Ma ị kwadowo m n’ihi iguzosi ike n’ezi ihe m,+ Ị ga-emekwa ka m nọrọ n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi.+ 13  Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi+ Malite na mgbe ebighị ebi ruo ọbụna mgbe ebighị ebi.+ Amen na Amen.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 41:9*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ebuliwo ikiri ụkwụ ya.”