Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 40:1-17

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid, abụ olu ụtọ. 40  N’ebe Jehova nọ ka m nwere olileanya siri ike,+ O wee tọọrọ m ntị n’ala nụ mkpu enyemaka m tiri.+   O wee dọpụta m n’olulu nke mmiri dị n’ime ya na-eme mkpọtụ,+ Nakwa n’apịtị nke ala ụrọ.+ O wee mee ka m guzoro na nkume dị elu;+ O mere ka ụkwụ m guzosie ike.+   O tinyekwara abụ ọhụrụ n’ọnụ m, Bụ́ otuto m ga-enye Chineke anyị.+ Ọtụtụ ndị ga-ahụ ya wee tụọ egwu,+ Ha ga-atụkwasịkwa Jehova obi.+   Obi ụtọ na-adịrị nwoke nke tụkwasịrị Jehova obi,+ Nke na-adịghị echigharịkwuru ndị isi ike, Ma ọ bụ ndị na-adaba n’ụgha.+   I mewo ọtụtụ ihe,+ Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị;+ Ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị.+ Ọ bụrụ na mụ asị ka m kọwa ha ma ọ bụ kwuwe banyere ha, Ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.+   Àjà na onyinye atọghị gị ụtọ;+ Ọ bụ gị meghere ntị m abụọ ndị a.+ Ị sịghị ka a chụọrọ gị àjà nsure ọkụ na àjà mmehie.+   N’ihi nke ahụ, asịrị m: “Lee, abịawo m,+ E dere ihe banyere m n’akwụkwọ mpịakọta.+   Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ,+ Iwu gị dịkwa n’ime obi m.+   Ana m ezi ozi ọma ezi omume n’ọgbakọ buru ibu.+ Lee! Adịghị m emechi ọnụ.+ Jehova, gị onwe gị maara nke ahụ nke ọma.+ 10  Ekpuchighị m ezi omume gị n’ime obi m.+ Akọsawo m ikwesị ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.+ Ezobeghị m obiọma* gị nakwa eziokwu gị n’ọgbakọ buru ibu.”+ 11  Gị onwe gị, Jehova, biko, ahapụla inwere m ọmịiko.+ Ka obiọma gị nakwa eziokwu gị na-eche m nche mgbe niile.+ 12  N’ihi na ọdachi gbara m gburugburu ruo mgbe a na-apụghị ịgụta ha ọnụ.+ Njehie m rikpuru m karịa otú m nwere ike ịhụ;+ Ha dị ọtụtụ karịa ntutu isi m,+ Adara m mbà n’obi.+ 13  Jehova, biko, ka ọ dị gị mma ịnapụta m.+ Jehova, biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+ 14  Ka ihere mee ha, ka e mechuokwa ha niile ihu,+ Bụ́ ndị na-achọ mkpụrụ obi m ka ha bibie ya.+ Ka ndị ọdachi m na-atọ ụtọ laghachi azụ, ka e menyekwa ha ihere.+ 15  Ka ha kporopụ anya n’ihi ihere na-eme ha,+ Bụ́ ndị na-asị m: “Ntọọ! Ntọọ!”+ 16  Ka ha nwee obi ụtọ ma ṅụrịa ọṅụ n’ime gị,+ Bụ́ ndị niile na-achọ gị.+ Ka ha na-ekwu mgbe niile, sị: “Ka e too Jehova,”+ Bụ́ ndị hụrụ nzọpụta gị n’anya.+ 17  Ma anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye.+ Jehova na-echeta m.+ Ị bụ onye na-enyere m aka na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.+ Chineke m, biko, egbula oge.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 40:10*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”