Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 39:1-13

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Jedutọn.+ Abụ olu ụtọ Devid. 39  Asịrị m: “M ga-eche ụzọ m nche+ Ka m wee ghara iji ire m mehie.+ M ga-eji ihe kechie ọnụ m iji chee ya nche, + Mgbe onye ọ bụla bụ́ onye ajọ omume nọ n’ihu m.”+   Agbara m nkịtị n’ekwughị okwu;+ Emechiri m ọnụ n’ekwughị ihe ọma,+ Egosipụtaghịkwa m na ihe na-egbu m mgbu.   Obi m wee na-ere ka ọkụ n’ime m;+ N’oge m nọ na-asụ ude, ọkụ ahụ nọ na-ere. Eji m ire m kwuo, sị:   “Jehova, biko, mee ka m mara ọgwụgwụ m,+ Mee ka m mara otú ụbọchị ndụ m ga-aha,+ Ka m wee mara otú ndụ m dịruru mkpụmkpụ.+   Lee! I mewo ka ụbọchị m dị naanị ole na ole;+ Oge ndụ m dị ka ihe efu n’ihu gị.+ N’ezie, mmadụ niile bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ,+ n’agbanyeghị na ha kwụsiri ike. Sila.   N’ezie, mmadụ na-ejegharị dị ka onyinyo.+ N’ezie, ha na-eme mkpọtụ na nkịtị.+ Mmadụ na-akpakọ akụ̀ n’amaghị onye ọ ga-ahapụrụ ya.+   Ugbu a kwa, Jehova, gịnị ka m na-ele anya ya? Olileanya m dị n’ebe ị nọ.+   Napụta m ná mmebi iwu m niile.+ Emela ka m bụrụ onye onye na-enweghị uche na-akọcha.+   M gbachiri nkịtị;+ enweghị m ike imeghe ọnụ m,+ N’ihi na gị onwe gị mere ihe.+ 10  Wepụ ihe otiti i tiri m.+ Nke m agwụla n’ihi mmeso ọjọọ i mesoro m.+ 11  Ị gbaziwo mmadụ site n’ịdọ ya aka ná ntị ka ọ ghara ijehie,+ Ị na-erichapụkwa ihe ya ndị dị oké ọnụ ahịa dị nnọọ ka nla si eri ihe.+ N’ezie, mmadụ niile bụ ume e kupụrụ ekupụ.+ Sila. 12  Jehova, biko, nụrụ ekpere m, Ṅaakwa ntị ná mkpu enyemaka m na-eti.+ Agbachila anya mmiri m nkịtị.+ N’ihi na abụ m onye mbịarambịa n’ebe ị nọ,+ Abụ m onye ọbịa dị ka nna nna m hà niile bụ.+ 13  Wepụ anya gị n’ebe m nọ, ka m wee gbasapụ ihu+ Tupu mụ anwụọ wee ghara ịnọkwa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji