Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 37:1-40

Abụ ọma Devid. א [Alef] 37  Ewela iwe n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ.+ Ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo.+   N’ihi na ha ga-akpọnwụ ọsọ ọsọ dị ka ahịhịa,+ Ha ga-achanwụkwa dị ka ahịhịa ndụ nke puru ọhụrụ.+ ב [Bet]   Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma;+ Biri n’ụwa, na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi.+   Ka ihe Jehova na-atọkwa gị ụtọ nke ukwuu,+ Ọ ga-enyekwa gị ihe niile obi gị na-arịọ.+ ג [Gimel]   Nyefee ụzọ gị n’aka Jehova,+ Dabere n’ebe ọ nọ,+ ya onwe ya ga-emekwa ihe.+   Ọ ga-eme ka ezi omume gị nwuo dị ka ìhè,+ Meekwa ka ikpe ziri ezi gị na-acha dị ka etiti ehihie.+ ד [Dalet]   Gbachie nkịtị n’ihu Jehova,+ Cheresie ya ike.+ Ewesola onye ọ bụla nke na-eme ka ụzọ ya gaa nke ọma iwe,+ Bụ́ onye na-eme ihe o chepụtara.+ ה [Hee]   Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma;+ Ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.+   N’ihi na a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ,+ Ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.+ ו [Wọọ] 10  N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ;+ Ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya.+ 11  Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa,+ Ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.+ ז [Zayin] 12  Onye ajọ omume na-akpa nkata megide onye ezi omume,+ Ọ na-atakwa ikikere ezé megide ya.+ 13  Jehova ga-achị ya ọchị,+ N’ihi na ọ na-ahụ na ụbọchị a ga-ebibi ya ga-abịa.+ ח [Het] 14  Ndị ajọ omume amịpụtawo mma agha, ha ekwewokwa ụta ha,+ Iji mee ka onye nọ n’ahụhụ na onye ogbenye daa,+ Iji gbuo ndị ụzọ ha ziri ezi.+ 15  Mma agha nke ha ga-aba n’obi ha,+ A ga-agbajikwa ụta ha.+ ט [Tet] 16  Ntakịrị ihe onye ezi omume nwere dị mma+ Karịa ihe buru ibu ọtụtụ ndị ajọ omume nwere.+ 17  N’ihi na a ga-agbaji ogwe aka ndị ajọ omume,+ Ma Jehova ga na-akwado ndị ezi omume.+ י [Yod] 18  Jehova maara ụbọchị niile nke ndị na-enweghị ntụpọ,+ Ihe nketa ha ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+ 19  Ihere agaghị eme ha n’oge ọdachi,+ Afọ ga-ejukwa ha n’oge ụnwụ.+ כ [Kaf] 20  N’ihi na ndị ajọ omume ga-ala n’iyi,+ Ndị iro Jehova ga-adịkwa ka ebe mara mma anụ na-ata ahịhịa; Ha ga-akpọnwụ.+ Ha ga-aghọ anwụrụ ọkụ, ha agakwaghị anọ.+ ל [Lamed] 21  Onye ajọ omume na-agbaziri ihe ma ọ dịghị akwụghachi ya,+ Ma onye ezi omume na-eme amara, na-enyekwa onyinye.+ 22  N’ihi na ndị ọ na-agọzi ga-enweta ụwa,+ Ma a ga-ebipụ ndị ọ na-akọcha.+ מ [Mem] 23  Ọ bụ Jehova na-eme ka nzọụkwụ nke dimkpa guzosie ike,+ Ụzọ ya na-atọkwa Ya ụtọ.+ 24  Ọ bụrụgodị na ọ daa, ọ gaghị akụ afọ n’ala,+ N’ihi na Jehova ji ya aka.+ נ [Nun] 25  Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi,+ Ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam,+ Ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.+ 26  Ọ na-eme amara ogologo ụbọchị dum, na-agbazinyekwa ihe,+ N’ihi ya, ụmụ ya ga-enweta ngọzi.+ ס [Samek] 27  Hapụ ihe ọjọọ, meekwa ihe ọma,+ Ka i wee biri ruo mgbe ebighị ebi.+ 28  N’ihi na Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya,+ Ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.+ ע [Ayin]A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi;+ Ma a ga-ebipụ ụmụ ndị ajọ omume.+ 29  Ndị ezi omume ga-enweta ụwa,+ Ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.+ פ [Pee] 30  Ọ bụ ọnụ onye ezi omume na-ekwupụta amamihe n’olu dị ala,+ Ọ bụkwa ire ya na-ekwu ihe ziri ezi.+ 31  Iwu Chineke ya dị n’obi ya;+ Ụkwụ agaghị ama ya jijiji.+ צ [Sadee] 32  Onye ajọ omume na-echebiri onye ezi omume,+ Na-achọkwa igbu ya.+ 33  Ma Jehova agaghị ahapụ ya n’aka onye ahụ,+ Ọ gaghịkwa akpọ ya onye ajọ omume mgbe a na-ekpe ya ikpe.+ ק [Kof] 34  Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya,+ Ọ ga-ebulikwa gị elu inweta ụwa.+ Mgbe a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ị ga-ahụ ya.+ ר [Resh] 35  Ahụwo m onye ajọ omume nke na-achị n’aka ike,+ Na-agbasakwa onwe ya dị ka osisi na-ama pokopoko n’ala a kụrụ ya.+ 36  N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nwụrụ, ma, lee, ọ nọkwaghị;+ Anọ m na-achọ ya, ma ahụghị m ya.+ ש [Shin] 37  Legide onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta anya, legidekwa onye ziri ezi anya, + N’ihi na ọ ga-enwe udo n’ọdịnihu.+ 38  Ma a ga-ala ndị niile na-emebi iwu n’iyi;+ Ndị ajọ omume agaghị enwe ọdịnihu.+ ת [Tọọ] 39  Nzọpụta ndị ezi omume na-esi n’aka Jehova;+ Ọ bụ ebe ha e wusiri ike n’oge ahụhụ.+ 40  Jehova ga-enyere ha aka ma meere ha ụzọ mgbapụ.+ Ọ ga-emere ha ụzọ ha ga-esi gbapụ n’aka ndị ajọ omume, ọ ga-azọpụtakwa ha,+ N’ihi na ha agbabawo n’ime ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji