Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 35:1-28

Abụ ọma Devid. 35  Jehova, biko, kpechite ọnụ m n’ikpe mụ na ndị na-emegide m nwere;+ Buso ha agha, bụ́ ndị na-ebuso m agha.+   Buru obere ọta na ọta ukwu,+ Biliekwa nyere m aka,+   Were ube na anyụike ihu abụọ zute ndị na-achụ m ọsọ.+ Sị mkpụrụ obi m: “Abụ m nzọpụta gị.”+   Ka ihere mee ndị na-achụ nta mkpụrụ obi m, ka e mechuokwa ha ihu.+ Ka e mee ka ndị na-eme atụmatụ ka ọdachi dakwasị m laghachi azụ, ka ihere meekwa ha.+   Ka ha dị ka igbogbo ọka nke ifufe na-ebu,+ Ka mmụọ ozi Jehova na-achụsasịkwa ha.+   Ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, ka ọ na-amịkwa amị,+ Ka mmụọ ozi Jehova na-achụkwa ha ọsọ.   N’ihi na ha egwuwo olulu were ụgbụ kpuchie ya ka m daba n’ime ya n’enweghị ihe m mere ha;+ Ha gwuuru ya mkpụrụ obi m n’enweghị ihe m mere ha.+   Ka mbibi bịakwasị ya na mberede,+ Ka ụgbụ o ji sie ọnyà jide ya;+ Ka ọ daba n’ime ya laa n’iyi.+   Ma ka mkpụrụ obi m ṅụrịa ọṅụ n’ime Jehova;+ Ka o nwee obi ụtọ ná nzọpụta ya.+ 10  Ka ọkpụkpụ m niile sị:+ “Jehova, ònye dị ka gị?+ Gị onye na-anapụta onye nọ n’ahụhụ n’aka onye ka ya ike,+ Ị na-anapụtakwa onye nọ n’ahụhụ na ogbenye n’aka onye na-apụnara ya ihe.”+ 11  Ndị akaebe bụ́ ndị na-eme ihe ike ebiliwo;+ Ha na-ajụ m ihe m na-amaghị.+ 12  Ha na-eji ihe ọjọọ akwụ m ụgwọ ihe ọma,+ Na-eme ka mkpụrụ obi m gbara aka.+ 13  Ma mụ onwe m, mgbe ha dara ọrịa, uwe m bụ ákwà iru uju,+ Eji m ibu ọnụ mekpaa mkpụrụ obi m ahụ́,+ Ekpere m lọghachikwutere m.+ 14  Echegburu m onwe m banyere ha dị ka à ga-asị na ha bụ enyi m na nwanne m,+ N’ihi ya, ejegharịrị m dị ka onye na-eruru nne ya uju.+ Obi dara m mbà n’ihi ịnọ ná mwute. 15  Mgbe m na-ete ụkwụ, ha ṅụrịrị ọṅụ wee gbakọọ;+ Ha gbakọrọ imegide m,+ Tituo m na mberede;+ Ha dọriri m, ha emechighị ọnụ.+ 16  Ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị na-akwa emo iji nweta ntakịrị ihe oriri+ Na-ata ikikere ezé megide m.+ 17  Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga na-ahụ ya?+ Biko, napụta mkpụrụ obi m ná mbibi ha na-eweta,+ Napụta otu ihe a m nwere+ n’aka ụmụ ọdụm tojuru etoju. 18  M ga-anọ n’ime ọgbakọ buru ibu too gị;+ M ga-eto gị n’etiti ìgwè mmadụ.+ 19  Biko, ekwela ka ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m;+ Ekwela ka ndị kpọrọ m asị na nkịtị tabie anya.+ 20  N’ihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu;+ Kama ọ bụ okwu aghụghọ ka ha na-echepụta+ Megide ndị nọ jụụ n’ụwa. 21  Ha na-emeghe ọnụ ha megide m.+ Ha sịrị: “Ntọọ! Ntọọ! anya anyị ahụwo ya.”+ 22  Jehova, ị hụwo ya.+ Agbachila nkịtị.+ Jehova, biko, anọla m n’ebe dị anya.+ 23  Biko, bilie, teta kpeere m ikpe,+ Chineke m, bụ́ Jehova, kpee ikpe m.+ 24  Jehova Chineke m, biko, kpee m ikpe dị ka ezi omume gị si dị,+ Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+ 25  Biko, ekwela ka ha sị n’obi ha: “Ntọọ, ọ bụ ihe mkpụrụ obi anyị chọrọ!”+ Ekwela ka ha sị: “Anyị elodawo ya.”+ 26  Ka ihere mee ha, ka e mechuokwa ha niile ihu,+ Bụ́ ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọdachi m.+ Ka ndị na-ebuli onwe ha elu megide m+ yiri ihere+ na mweda n’ala dị ka uwe. 27  Ka ndị ezi omume m na-atọ ụtọ tie mkpu ọṅụ ma ṅụrịa ọṅụ,+ Ka ha na-ekwu mgbe niile, sị:+ “Ka e too Jehova, bụ́ onye udo nke ohu ya na-atọ ụtọ.”+ 28  Ka ire m kwupụtakwa ezi omume gị n’olu dị ala,+ Ka o kwupụta otuto gị ogologo ụbọchị dum.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji