Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 34:1-22

Abụ ọma Devid, mgbe o mere ka onye isi na-adịghị mma+ n’ihu Abimelek, nke mere na ọ chụpụrụ ya, o wee pụọ. א [Alef] 34  M ga-agọzi Jehova mgbe niile;+ Otuto ya ga-adị n’ọnụ m mgbe niile.+ ב [Bet]   Mkpụrụ obi m ga-eji Jehova nyaa isi;+ Ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya wee ṅụrịa ọṅụ.+ ג [Gimel]   Soronụ m too Jehova,+ Ka anyị niile bulie aha ya elu.+ ד [Dalet]   Ajụrụ m Jehova ase, o wee za m,+ Ọ napụtakwara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.+ ה [Hee]   Ha lekwasịrị anya n’ebe ọ nọ, ihu ha wee na-egbuke egbuke,+ Ọ dịghịkwa mgbe a ga-emenye ha ihere n’ihu.+ ז [Zayin]   Onye a nke nọ n’ahụhụ kpọkuru Jehova, o wee nụ ya.+ Ọ zọpụtakwara ya n’ahụhụ ya niile.+ ח [Het]   Mmụọ ozi Jehova na-ama ụlọikwuu gburugburu ndị na-atụ egwu ya,+ Ọ na-anapụtakwa ha.+ ט [Tet]   Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma;+ Obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke gbabara n’ime ya.+ י [Yod]   Tụọnụ egwu Jehova, unu ndị nsọ ya,+ N’ihi na ọ dịghị ihe kọrọ ndị na-atụ egwu ya.+ כ [Kaf] 10  Ụmụ ọdụm tojuru etoju nọ n’enweghị ihe oriri, agụụ jikwa ha;+ Ma ndị na-achọ Jehova, ọ dịghị ihe ọma ga-akọ ha.+ ל [Lamed] 11  Bịanụ, ụmụ m, geenụ m ntị;+ Ọ bụ egwu Jehova ka m ga-akụziri unu.+ מ [Mem] 12  Ònye ka ndụ na-atọ ụtọ,+ Bụ́ onye ọ na-agụ agụụ ịhụ ọtụtụ ụbọchị nke ihe ọma?+ נ [Nun] 13  Chee ire gị nche ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,+ Cheekwa egbugbere ọnụ gị nche ka ọ ghara ikwu okwu aghụghọ.+ ס [Samek] 14  Si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị, mee ihe ọma;+ Chọọ udo, chụsookwa ya.+ ע [Ayin] 15  Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ,+ Ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.+ פ [Pee] 16  Ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,+ Iji mee ka a ghara ịkpọtụ ha aha n’ụwa.+ צ [Sadee] 17  Ha tiri mkpu, Jehova wee nụ ya,+ Ọ napụtakwara ha n’ahụhụ ha niile.+ ק [Kof] 18  Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso;+ Ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.+ ר [Resh] 19  Ọdachi ndị na-adakwasị onye ezi omume dị ọtụtụ,+ Ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.+ ש [Shin] 20  Ọ na-eche ọkpụkpụ niile nke onye ahụ nche; E nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.+ ת [Tọọ] 21  Ọdachi ga-egbu onye ajọ omume;+ A ga-ama ndị kpọrọ onye ezi omume asị ikpe.+ 22  Jehova na-agbapụta mkpụrụ obi ndị ohu ya;+ Ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ndị gbabara n’ime ya a ga-ama ikpe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji