Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 33:1-22

33  Unu ndị ezi omume, tienụ mkpu ọṅụ n’ihi Jehova.+ Ndị ziri ezi kwesịrị inye ya otuto.+   Jirinụ ụbọ akwara nye Jehova ekele;+ Jirinụ ụbọ nwere akwara iri+ bụkuo ya abụ olu ụtọ.   Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;+ Werenụ ike unu niile kpọọ ụbọ akwara, tiekwanụ mkpu ọṅụ.+   N’ihi na okwu Jehova ziri ezi,+ Ọ na-arụkwa ọrụ ya dum n’ikwesị ntụkwasị obi.+   Ọ hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya.+ Ụwa jupụtara n’obiọma Jehova.+   Ọ bụ site n’okwu Jehova ka e kere eluigwe,+ Ọ bụkwa site na mmụọ nke ọnụ ya ka e kere ihe niile dị n’ime ya.+   O mere ka mmiri oké osimiri sọkọta ọnụ dị ka mmiri e gbochiri egbochi,+ Meekwa ka mmiri na-ekwo ekwo sọkọta ọnụ n’ụlọ nkwakọba ihe.   Ka ndị niile bi n’ụwa tụọ egwu Jehova.+ Ka ndị niile bi n’elu ala tụọ ya ụjọ.+   N’ihi na ya onwe ya kwuru okwu, o wee mee;+ Ya onwe ya nyere iwu, o wee dị otú ahụ.+ 10  Jehova akpaghasịwo atụmatụ nke mba dị iche iche;+ O mebiwo ihe ndị dị iche iche chepụtara.+ 11  Nzube Jehova ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi;+ Echiche obi ya na-adị site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+ 12  Obi ụtọ na-adịrị mba nke Jehova bụ Chineke ya,+ Bụ́ ndị ọ họọrọ ịbụ ihe nketa ya.+ 13  Jehova si n’eluigwe na-ele anya,+ Ọ na-ahụ ụmụ mmadụ niile.+ 14  O si n’ebe guzosiri ike o bi+ Na-ele ndị niile bi n’elu ụwa anya. 15  Ọ bụ ya kpụrụ obi ha niile;+ Ọ na-enyocha ihe niile ha na-eme.+ 16  Ọ dịghị eze nke ọ bụ ìgwè ndị agha na-azọpụta;+ Ọ bụghịkwa ike dị ukwuu ka a na-eji anapụta dike.+ 17  Ịnyịnya bụ ihe efu ma a bịa n’ịzọpụta mmadụ,+ Ike dị ukwuu o nwere adịghịkwa emere mmadụ ụzọ mgbapụ.+ 18  Lee! Anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ,+ Bụ́ ndị na-echere obiọma ya,+ 19  Iji napụta mkpụrụ obi ha n’aka ọnwụ,+ Nakwa iji chebe ha ndụ n’oge ụnwụ.+ 20  Mkpụrụ obi anyị anọwo na-atụ anya Jehova.+ Ọ bụ onye na-enyere anyị aka na ọta anyị.+ 21  N’ihi na ọ bụ n’ime ya ka obi anyị na-aṅụrị ọṅụ;+ N’ihi na ọ bụ n’aha nsọ ya ka anyị tụkwasịrị obi.+ 22  Jehova, biko, ka obiọma gị dịkwasị anyị,+ N’ihi na anyị anọgidewo na-echere gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji