Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 32:1-11

Abụ ọma Devid. Maskil. 32  Obi ụtọ na-adịrị onye a gbaghaara nnupụisi ya, onye e kpuchiri mmehie ya.+   Obi ụtọ na-adịrị onye Jehova na-adịghị agụkọrọ njehie,+ Onye aghụghọ na-adịghịkwa na mmụọ ya.+   Mgbe m gbara nkịtị, ike gwụrụ ọkpụkpụ m n’ihi ude m na-asụ ogologo ụbọchị dum.+   N’ihi na aka gị dị arọ n’ahụ́ m ehihie na abalị.+ Ndụ m akpọọla nkụ dị ka ihe anwụ oge ọkọchị mịkpọrọ.+ Sila.   N’ikpeazụ, ekwupụtaara m gị mmehie m, ekpuchighịkwa m njehie m.+ Asịrị m: “M ga-ekwupụtara Jehova mmebi iwu m.”+ Gị onwe gị gbaghaara m njehie m na mmehie m.+ Sila.   Ọ bụ ya mere onye ọ bụla nke na-eguzosi ike n’ihe ga-eji kpekuo gị ekpere+ N’oge a ka pụrụ ịchọta gị.+ Ma idei mmiri agaghị emetụ ya.+   Ị bụụrụ m ebe nzuzo; ị ga-echebe m ka ahụhụ ghara ịdakwasị m.+ Ị ga-eji mkpu ọṅụ gbaa m gburugburu maka imere m ụzọ mgbapụ.+ Sila.   “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso.+ M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.+   Unu emela dị ka à ga-asị na unu bụ ịnyịnya ma ọ bụ ịnyịnya ibu na-enweghị uche,+ Nke a na-eji eriri ma ọ bụ ụdọ na-achịkwa+ Tupu ya abịaruo gị nso.”+ 10  Ihe mgbu onye ajọ omume na-enwe dị ọtụtụ;+ Ma onye tụkwasịrị Jehova obi, obiọma* na-agba ya gburugburu.+ 11  Ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;+ Tienụ mkpu ọṅụ, unu niile ndị obi ha ziri ezi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 32:10*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”