Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 25:1-22

Abụ ọma Devid. א [Alef] 25  Jehova, ọ bụ gị ka m na-enye mkpụrụ obi m.+ ב [Bet]   Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi;+ Ekwela ka ihere mee m. Ekwela ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+ ג [Gimel]   Ọ dịghịkwa onye nwere olileanya n’ebe ị nọ ihere ga-eme.+ Ihere ga-eme ndị na-aghọ aghụghọ n’efu.+ ד [Dalet]   Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị;+ Zi m ụzọ gị.+ ה [Hee]   Mee ka m jee ije n’eziokwu gị, kụziere m ihe,+ N’ihi na ị bụ Chineke nke nzọpụta m.+ ו [Wọọ]Ọ bụ n’ebe ị nọ ka olileanya m dị ogologo ụbọchị dum.+ ז [Zayin]   Jehova, biko, cheta ebere gị+ na obiọma* gị,+ N’ihi na ha dị malite na mgbe ebighị ebi.+ ח [Het]   Biko, echetala mmehie m mere n’oge m bụ nwata nakwa nnupụisi m.+ Cheta m dị ka obiọma gị si dị,+ N’ihi ịdị mma gị, Jehova.+ ט [Tet]   Jehova dị mma, bụrụkwa onye ezi omume.+ Ọ bụ ya mere o ji ezi ndị mmehie ụzọ.+ י [Yod]   Ọ ga-eme ka ndị dị umeala n’obi na-eje ije ná mkpebi ikpe ya,+ Ọ ga-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.+ כ [Kaf] 10  Ụzọ Jehova niile bụ obiọma na eziokwu Nye ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ya+ na ihe ncheta ya.+ ל [Lamed] 11  N’ihi aha gị, Jehova,+ Biko, gbaghara njehie m, n’ihi na ọ dị ukwuu.+ מ [Mem] 12  Olee onye na-atụ egwu Jehova?+ Ọ ga-ezi ya ụzọ ọ ga-ahọrọ.+ נ [Nun] 13  Mkpụrụ obi ya ga-ebi n’ịdị mma,+ Ụmụ ya ga-enweta ụwa.+ ס [Samek] 14  Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya,+ Ọ bụkwa ya na ha na-agba ndụ, iji mee ka ha mara ọgbụgba ndụ ya.+ ע [Ayin] 15  Anya m dị n’ebe Jehova nọ mgbe niile,+ N’ihi na ọ bụ ya na-adọpụta ụkwụ m n’ụgbụ.+ פ [Pee] 16  Chee ihu n’ebe m nọ, meere m amara;+ N’ihi na anọ m naanị m, anọkwa m n’ahụhụ.+ צ [Sadee] 17  Ihe na-enye m nsogbu n’obi adịwo ọtụtụ;+ Mee ka m si ná nsogbu m nọ na ya pụta.+ ר [Resh] 18  Hụrụ ahụhụ m na nsogbu m,+ Gbagharakwa m mmehie m niile.+ 19  Lee ka ndị iro m si dị ọtụtụ,+ Ha kpọkwara m asị nke ukwuu.+ ש [Shin] 20  Chee mkpụrụ obi m nche ma napụta m.+ Ekwela ka ihere mee m, n’ihi na agbabawo m n’ime gị.+ ת [Tọọ] 21  Ka iguzosi ike n’ezi ihe na ezi omume chebe m,+ N’ihi na enwere m olileanya n’ebe ị nọ.+ 22  Chineke, biko, napụta Izrel n’ahụhụ ya niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 25:6*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”