Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 24:1-10

Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ. 24  Ọ bụ Jehova nwe ụwa na ihe jupụtara n’ime ya,+ Elu ala nakwa ndị bi na ya.+   N’ihi na ọ tọsiwo ntọala ya ike n’elu oké osimiri,+ O mewokwa ka o guzosie ike n’elu osimiri.+   Ònye ga-arịgo n’ugwu Jehova,+ Ònyekwa ga-agbago n’ebe nsọ ya?+   Ọ bụ onye ọ bụla aka ya dị ọcha, onye obi ya dịkwa ọcha,+ Onye na-adịghị eji mkpụrụ obi M* eme ihe efu,+ Onye na-adịghịkwa aṅụ iyi ụgha.+   Ọ ga-anata ngọzi n’aka Jehova,+ Natakwa ezi omume n’aka Chineke nke nzọpụta ya.+   Nke a bụ ọgbọ nke ndị na-achọ ya, Nke ndị na-achọ ihu ọma gị, Chineke nke Jekọb.+ Sila.   “Welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ámá niile,+ Meenụ onwe unu ka unu dị elu, unu ọnụ ụzọ ndị dịwara kemgbe ogologo oge,+ Ka Eze dị ebube wee bata!”+   “Ònyezi bụ Eze a dị ebube?”+ “Ọ bụ Jehova bụ́ onye dị ike ma nwee ume,+ Jehova onye bụ́ dike n’agha.”+   “Welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ámá niile;+ Ee, welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ndị dịwara kemgbe ogologo oge, Ka Eze dị ebube wee bata!”+ 10  “Ònyezi bụ Eze a dị ebube?” “Jehova nke ụsụụ ndị agha—ọ bụ ya bụ Eze ahụ dị ebube.”+ Sila.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 24:4*  Nke a na-ekwu banyere Jehova.