Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 23:1-6

Abụ olu ụtọ Devid. 23  Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ.+ Ọ dịghị ihe ga-akọ m.+   Ọ na-eme ka m makpuru n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara;+ Ọ na-edu m n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara.+   Ọ na-eme ka mkpụrụ obi m nwetaghachi ume.+ Ọ na-edu m n’ụzọ ezi omume n’ihi aha ya.+   Ọ bụrụgodị na mụ ejee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,+ Agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla,+ N’ihi na ị nọnyeere m;+ Ọ bụ mkpara gị na mkpanaka gị na-akasi m obi.+   Ị na-edoziri m tebụl n’ihu ndị iro m.+ I tewo isi m mmanụ;+ Iko m juru n’ọnụ.+   N’ezie, ịdị mma na obiọma* ga na-achụ m ụbọchị niile nke ndụ m;+ M ga-ebikwa n’ụlọ Jehova ruo ogologo ụbọchị niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 23:6*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”