Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 22:1-31

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Nne Ele Isi Ụtụtụ. Abụ olu ụtọ Devid. 22  Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?+ Gịnị mere i ji nọrọ n’ebe dị anya ghara ịbịa zọpụta m,+ Wee ghara ige ntị ná mkpu arịrị m na-eti?+   Chineke m, m na-akpọku gị n’ehihie, ma ị dịghị aza;+ M na-akpọkukwa gị n’abalị, adịghị m emechi ọnụ.+   Ma gị onwe gị dị nsọ,+ Onye bi n’etiti otuto Izrel.+   Ọ bụ gị ka nna anyị hà tụkwasịrị obi;+ Ha tụkwasịrị gị obi, i wee na-emere ha ụzọ mgbapụ.+   Ọ bụ gị ka ha tikuru,+ ha wee lanahụ;+ Gị ka ha tụkwasịrị obi, ihere emeghịkwa ha.+   Ma abụ m idide,+ abụghị m mmadụ, Onye ndị mmadụ na-akọcha nakwa onye ndị mmadụ na-eleda anya.+   Ndị niile na-ahụ m na-akwa m emo;+ Ha na-emeghe ọnụ ha iji kwaa m emo, ha na-efufekwa isi, na-asị:+   “O nyefere onwe ya n’aka Jehova.+ Ya meere ya ụzọ mgbapụ!+ Ya napụta ya, ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya!”+   N’ihi na ọ bụ gị bụ Onye si n’afọ sepụta m,+ Onye mere ka obi ruo m ala mgbe m na-aṅụ ara nne m.+ 10  E nyefere m n’aka gị malite n’oge m nọ n’akpa nwa;+ Ị bụ Chineke m malite n’oge m nọ n’afọ nne m.+ 11  Anọla m n’ebe dị anya, n’ihi na nsogbu dị nso,+ N’ihi na enweghị m onye inyeaka ọzọ.+ 12  Ọtụtụ ụmụ oké ehi agbaala m gburugburu;+ Oké ehi ndị dị ike nke Beshan agbawo m gburugburu.+ 13  Ha emeghewo ọnụ ha imegide m,+ Dị ka ọdụm nke nọ na-adọri anụ ma na-ebigbọ.+ 14  A wụpụwo m dị ka mmiri,+ Ọkpụkpụ m niile ekwokapụsịwo.+ Obi m dịzi ka mgbá aṅụ;+ Ọ gbazewo n’ime ime afọ m.+ 15  Ike adịkwaghị m, adịzi m ka ibe eju,+ E mewokwa ka ire m rapara n’ágbụ̀ m;+ Ọ bụkwa n’ájá ọnwụ ka ị na-eme ka m nọrọ.+ 16  N’ihi na nkịta agbawo m gburugburu;+ Nzukọ ndị na-eme ihe ọjọọ agbawo m okirikiri.+ Ha na-ata m arụ n’aka nakwa n’ụkwụ dị ka ọdụm.+ 17  M nwere ike ịgụ ọkpụkpụ m niile ọnụ.+ Ha onwe ha na-ele anya, ha na-ele m anya.+ 18  Ha kere uwe m n’etiti onwe ha,+ Ha fekwara nza maka uwe m.+ 19  Ma gị onwe gị, Jehova, biko, anọla n’ebe dị anya.+ Gị onye bụ́ ike m,+ bịa ngwa ngwa nyere m aka.+ 20  Biko, napụta mkpụrụ obi m ná mma agha,+ Napụta otu ihe a m nwere n’aka nkịta;+ 21  Biko, zọpụta m n’ọnụ ọdụm,+ Za m ma zọpụta m na mpi atụ́.+ 22  M ga-akọsara ụmụnna m+ aha gị;+ M ga-anọ n’ime ọgbakọ too gị.+ 23  Unu ndị na-atụ egwu Jehova, toonụ ya!+ Unu niile bụ́ mkpụrụ Jekọb, nyenụ ya otuto!+ Ka egwu ya jidekwa unu, unu niile bụ́ mkpụrụ Izrel.+ 24  N’ihi na ọ dịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya,+ Ọ dịghịkwa eleghara ya anya;+ O wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ,+ Mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.+ 25  M ga-anọ n’ime ọgbakọ dị ukwuu too gị n’ihi ihe i mere;+ M ga-emezu nkwa m n’ihu ndị na-atụ egwu ya.+ 26  Ndị dị umeala n’obi ga-eri ihe rijuo afọ;+ Ndị na-achọ Jehova ga-eto ya.+ Ka obi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+ 27  Nsọtụ niile nke ụwa ga-echeta Jehova ma chigharịkwuru ya.+ Ezinụlọ niile nke mba dị iche iche ga-akpọkwa isiala n’ihu gị.+ 28  N’ihi na ọ bụ Jehova nwe ọbụbụeze,+ Ọ bụkwa ya na-achị mba niile.+ 29  Ndị ọgaranya niile nọ n’ụwa ga-eri ihe kpọọ isiala;+ Ndị niile na-agbada n’ájá ga-ehulata ala n’ihu ya,+ Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka mkpụrụ obi nke ya na-adị ndụ.+ 30  Ụmụ a ka ga-amụ ga-ejere ya ozi;+ A ga-akọrọ ọgbọ ọzọ banyere Jehova.+ 31  Ha ga-abịa kọọrọ ndị a ka ga-amụ amụ+ Banyere ezi omume ya, ha ga-akọrọ ha na ọ bụ ya mere ihe a.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji