Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 2:1-12

2  Gịnị mere mba niile ji na-agba ghara ghara,+ Mba dị iche iche anọrọkwa na-atamu ihe efu?+   Ndị eze ụwa eguzorokwa,+ Ndị isi ezukọtawokwa dị ka otu onye+ Imegide Jehova+ na imegide onye o tere mmanụ,+   Sị: “Ka anyị dọbisịa agbụ ha,+ Tọpụsịakwa ụdọ ha kere anyị!”+   Onye ahụ nke nọ ọdụ n’eluigwe+ ga-achị ọchị; Jehova ga-akwa ha emo.+   N’oge ahụ, ọ ga-agwa ha okwu n’iwe ya,+ Ọ ga-emekwa ka ha maa jijiji n’iwe ya dị ọkụ,+   Sị: “Mụ onwe m emewo ka eze m nọdụ n’ocheeze+ Na Zayọn,+ bụ́ ugwu nsọ m.”+   Ka m kwuo ihe Jehova nyere n’iwu; Ọ gwara m, sị: “Ị bụ ọkpara m;+ Mụ onwe m aghọwo nna gị taa.+   Rịọ m,+ ka m nye gị mba dị iche iche ka ha bụrụ ihe nketa gị,+ Nyekwa gị nsọtụ niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị.+   Ị ga-eji mkpanaka ígwè kụpịa ha,+ Ị ga-akụri ha ka arịa ọkpụite kpụrụ.”+ 10  Ugbu a kwa, unu ndị eze, jirinụ nghọta mee ihe; Kwenụ ka a gbazie unu, unu ndị ikpe nke ụwa.+ 11  Jirinụ egwu jeere Jehova ozi,+ Jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ.+ 12  Susuonụ ọkpara ya ọnụ,+ ka O wee ghara iwe iwe, Ka unu wee ghara ịla n’iyi wee si n’ụzọ pụọ,+ N’ihi na iwe ya na-adị ọkụ ngwa ngwa.+ Obi ụtọ na-adịrị ndị niile na-agbaba n’ime ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji