Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 17:1-15

Ekpere Devid. 17  Jehova, biko, nụrụ ihe ziri ezi; ṅaa ntị n’ákwá m na-ebesara gị;+ Ṅaa ntị n’ekpere m ji egbugbere ọnụ nke aghụghọ na-adịghị na-ekpe.+   Ka ikpe m si n’ihu gị bịa;+ Ka anya gị hụ ịkwụwa aka ọtọ.+   I nyochawo obi m, i nyochawo m n’abalị,+ Ị nụchawo m; ị ga-achọpụta na emeghị m atụmatụ ihe ọjọọ.+ Ọnụ m agaghị eme mmehie.+   A bịa n’ihe ụmụ mmadụ na-eme, N’ihi okwu si n’egbugbere ọnụ gị, m na-ezere ụzọ onye na-apụnara mmadụ ihe.+   Ka ụkwụ m dịgide n’ụzọ gị,+ Bụ́ ebe a na-agaghị eme ka ụkwụ m maa jijiji.+   Mụ onwe m na-akpọku gị, Chineke, n’ihi na ị ga-aza m.+ Tọọrọ m ntị n’ala. Nụrụ ihe m na-ekwu.+   Mee ka mmeso obiọma* gị dị ebube,+ gị Onye Nzọpụta nke ndị na-achọ ebe ha ga-agbaba Iji zere ndị na-enupụrụ aka nri gị isi.+   Chebe m dị ka nwa anya gị,+ Zobe m na ndò nku gị,+   N’ihi ndị ajọ omume ndị bukọwooro ihe m. Ndị iro bụ́ ndị na-emegide mkpụrụ obi m gbara m gburugburu na-achọ ịnwụde m.+ 10  Ha ejiriwo abụba ha kpuchie onwe ha;+ Ha ejiriwo mpako kwuo okwu;+ 11  Ma ha agbawo anyị gburugburu ugbu a n’ebe anyị na-azọ ụkwụ;+ Ha na-ele anyị anya iji mee ka anyị daruo ala.+ 12  Onye ọ bụla n’ime ha yiri ọdụm nke agụụ ịdọri anụ na-agụ,+ Yiekwa nwa ọdụm makpu n’ebe zoro ezo. 13  Biko, Jehova, bilie; zute ya ihu na ihu;+ Mee ka o huru ehuru; jiri mma agha gị meere mkpụrụ obi m ụzọ ọ ga-esi gbapụ n’aka onye ajọ omume,+ 14  Jehova, jiri ogwe aka gị mee ka m gbapụ n’aka ndị mmadụ,+ N’aka ndị mmadụ nọ n’usoro ihe a,+ bụ́ ndị òkè ha dị ná ndụ a,+ Ndị i jikwa akụ̀ gị zoro ezo mee ka afọ ju,+ Ndị mụrụ ụmụ otú zuuru ha,+ Ndị na-ahapụrụ ụmụ ha akụ̀ ha kpatara.+ 15  Ma mụ onwe m, n’ezi omume ka m ga-ahụ ihu gị;+ Afọ ga-eju m mgbe m ga-eteta ịhụ otú ị dị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 17:7*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”