Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 15:1-5

Abụ olu ụtọ Devid. 15  Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị?+ Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị?+   Ọ bụ onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ,+ onye na-eme ezi omume,+ Onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.+   Ọ dịghị eji ire ya ekwutọ mmadụ.+ Ọ dịghị eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ,+ Ọ dịghịkwa akọcha onye ya na ya na-akpachi anya.+   N’anya ya, onye ọ bụla nke na-abaghị n’ihe bụ onye a jụrụ ajụ,+ Ma ndị na-atụ egwu Jehova ka ọ na-asọpụrụ.+ Ọ bụrụ na ọ ṅụọ iyi nke pụrụ iwetara ya nsogbu, ọ dịghị agbanwe ya.+   Ọ dịghị ana ọmụrụ nwa n’ego ọ gbazinyere mmadụ,+ Ọ dịghịkwa eri ngarị iji megide onye aka ya dị ọcha.+ A gaghị eme ka onye na-eme ihe ndị a maa jijiji ma ọlị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji