Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 149:1-9

149  Toonụ Jaa!+ Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ,+ Bụọnụ abụ otuto ya n’ime ọgbakọ nke ndị na-eguzosi ike n’ihe.+   Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ n’ime Onye Ukwu kere ya,+ Ka ụmụ Zayọn ṅụrịa ọṅụ n’ime Eze ha.+   Ka ha jiri ịgba egwú too aha ya.+ Ka ha were obere ịgbà na ụbọ akwara bụkuo ya abụ olu ụtọ.+   N’ihi na ihe ndị Jehova na-atọ ya ụtọ.+ Ọ na-eji nzọpụta achọ ndị dị umeala n’obi mma.+   Ka ndị na-eguzosi ike n’ihe ṅụrịa ọṅụ ná nsọpụrụ ha; Ka ha tie mkpu ọṅụ n’elu ihe ndina ha.+   Ka abụ e ji eto Chineke dịrị n’akpịrị ha,+ Ka mma agha ihu abụọ dịrị n’aka ha,+   Iji bọọ ọbọ n’ahụ́ mba dị iche iche,+ Baakwara mba dị iche iche mba,+   Iji kee ndị eze ha agbụ,+ Tụọkwa ndị ha a na-asọpụrụ ịgà ígwè.   Iji mezuo mkpebi ikpe e dere ede n’isi ha.+ Ịma mma dị otú ahụ bụ nke ndị niile na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.+ Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji