Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 143:1-12

Abụ olu ụtọ Devid. 143  Jehova, biko, nụrụ ekpere m;+ Ṅaa ntị n’arịrịọ m.+ Jiri ikwesị ntụkwasị obi gị za m n’ezi omume gị.+   Emela ka gị na ohu gị baa n’ikpe;+ N’ihi na ọ dịghị onye dị ndụ nke pụrụ ịbụ onye ezi omume n’ihu gị.+   N’ihi na onye iro achụwo mkpụrụ obi m ọsọ;+ O gwepịaruwo mkpụrụ obi m ala.+ O mewo ka m biri n’ebe gbara ọchịchịrị dị ka ndị nwụrụ anwụ kemgbe a na-amaghị ama.+   Ike na-agwụkwa mmụọ m+ n’ime m; Obi m adawo mbà n’ime m+.   Echetawo m oge dị anya gara aga;+ Atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum;+ Eji m obi m dum na-echebara ọrụ aka gị echiche.+   Agbasapụworo m gị aka m;+ Agụụ gị na-agụ mkpụrụ obi m otú agụụ mmiri si agụ ala kpọrọ nkụ.+ Sila.   Jehova, biko, mee ngwa za m.+ Ike agwụla mmụọ m.+ Ewepụla ihu gị n’ebe m nọ,+ Ma ọ́ bụghị ya, m ga-adị ka ndị na-agbada n’olulu.+   Mee ka m nụrụ obiọma* gị n’ụtụtụ,+ N’ihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi.+ Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ije ije na ya,+ N’ihi na ọ bụ gị ka m nyere mkpụrụ obi m.+   Jehova, biko, napụta m n’aka ndị iro m.+ Agbabawo m n’ime gị.+ 10  Kụziere m ime uche gị,+ N’ihi na ị bụ Chineke m.+ Mmụọ gị dị mma;+ Ka ọ na-edu m n’ala ezi omume.+ 11  Jehova, biko, chebe m ndụ+ n’ihi aha gị.+ Napụta mkpụrụ obi m n’ahụhụ+ n’ihi ezi omume gị.+ 12  N’obiọma gị, mechie ọnụ ndị iro m;+ Bibiekwa ndị niile na-ebuso mkpụrụ obi m iro,+ N’ihi na abụ m ohu gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 143:8*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”