Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 141:1-10

Abụ olu ụtọ Devid. 141  Jehova, akpọkuwo m gị.+ Biko, bịakwute m ngwa ngwa.+ Nụrụ olu m mgbe m kpọkuru gị.+   Ka ekpere m bụrụ ihe a kwadebere n’ihu gị+ dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ,+ Ka mgbasa m na-agbasa ọbụ aka m dịrị ka àjà ọka* a na-achụ ná mgbede.+   Jehova, biko, nyere m aka ka m chee ọnụ m nche;+ Nyere m aka ka m chee egbugbere ọnụ m nche.+   Ekwela ka obi m dịrị n’ihe ọjọọ ọ bụla,+ Ka m wee ghara iso ndị na-eme ihe ọjọọ+ Na-eme arụ site n’ime omume ọjọọ,+ Ka m wee ghara iri nri ụtọ ha.+   Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ ga-abụ obiọma;*+ Ọ bụrụkwa na ọ baara m mba, ọ ga-abụ mmanụ a wụsara m n’isi,+ Nke isi m na-agaghị achọ ịjụ.+ N’ihi na m ka ga na-ekpere ha ekpere ọbụna n’oge ọdachi dakwasịrị ha.+   E siwo n’akụkụ nkume dị elu tụda ndị ikpe ha,+ Ma ha anụwo ihe m kwuru, mara na ọ dị mma.+   Dị ka mgbe mmadụ warisịrị nkụ wụsa n’ala, Otú a ka a ghasaworo ọkpụkpụ anyị n’ọnụ Shiol.+   Otú ọ dị, anya m dị n’ebe ị nọ,+ Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị.+ Agbabawo m n’ime gị.+ Awụpụla mkpụrụ obi m dị ka mmiri.+   Chebe m ka m ghara ịdaba n’ọnyà ha siiri m,+ Ka m gharakwa ịdaba n’ọnyà ndị na-eme ihe ọjọọ siri.+ 10  Ndị ajọ omume ga-adabakọta n’ụgbụ ha,+ Ma mụ onwe m ga-agafere.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 141:2*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
Ọma 141:5*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”