Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 140:1-13

Maka onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 140  Jehova, biko, napụta m n’aka ndị ọjọọ;+ Chebe m ka m ghara ịdaba n’aka onye na-eme ihe ike,+   Ndị kpara nkata ihe ọjọọ n’obi ha,+ Bụ́ ndị na-awakpo m ogologo ụbọchị dum dị ka à ga-asị na anyị na-alụ agha.+   Ha amụwo ire ha amụ dị ka ire agwọ;+ Elò nke ajụala nwere mpi dị n’okpuru egbugbere ọnụ ha.+ Sila.   Jehova, biko, chebe m ka m ghara ịdaba n’aka onye ajọ omume;+ Chebe m ka m ghara ịdaba ọbụna n’aka onye na-eme ihe ike,+ Ndị kpaworo nkata ime ka m zọhie ụkwụ.+   Ndị na-ebuli onwe ha elu esiworo m ọnyà;+ Ha atụsasịwokwa ụdọ dị ka ụgbụ n’akụkụ ụzọ.+ Ha esiworo m ọnyà.+ Sila.   Asịwo m Jehova: “Ị bụ Chineke m.+ Jehova, biko, ṅaa ntị n’olu arịrịọ m.”+   Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị,+ ike nke nzọpụta m,+ I kpuchiwo isi m n’ụbọchị agha.+   Jehova, biko, enyela onye ajọ omume ihe na-agụ ya.+ Akwadola nkata ọ na-akpa, ka ha wee ghara ibuli onwe ha elu.+ Sila.   Ka nsogbu egbugbere ọnụ nke ndị gbara m gburugburu kpatara+ Zuo ha ahụ́.+ 10  Ka a wụkwasị ha icheku ọkụ.+ Ka a kwaba ha n’ọkụ,+ n’olulu mmiri, ka ha wee ghara ibilite.+ 11  Onye na-ekwuwa ọnụ—ka ọ ghara iguzosi ike n’ụwa.+ Onye na-eme ihe ike—ka ihe ọjọọ nweta ya ma tie ya ihe otiti ugboro ugboro.+ 12  Amaara m nke ọma na Jehova ga-eme+ Ka onye nọ n’ahụhụ nweta ihe ruuru ya, ka ndị ogbenye nweta ikpe ziri ezi.+ 13  N’ezie, ndị ezi omume ga-enye aha gị ekele;+ Ndị ziri ezi ga-ebi n’ihu gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji