Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 14:1-7

Ntụziaka e nyere onye nduzi.  Abụ ọma Devid. 14  Onye nzuzu asịwo n’obi ya: “Jehova adịghị.”+ Ha emewo omume na-eweta mbibi,+ ha emewo arụ n’omume ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma.+   Ma Jehova si n’eluigwe ledata anya lee ụmụ mmadụ,+ Iji hụ ma ọ̀ dị onye nwere nghọta, onye na-achọ Jehova.+   Ha niile esiwo n’ụzọ pụọ,+ ha niile rụrụ arụ;+ Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma,+ Ọbụnadị otu onye.+   Ọ̀ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla maara ihe n’ime ndị na-eme ihe ọjọọ,+ Bụ́ ndị na-eri ndị m dị ka à ga-asị na ha bụ nri?+ Ha adịghị akpọku Jehova.+   Oké ụjọ jidere ha n’ebe ahụ,+ N’ihi na Jehova nọ n’etiti ọgbọ onye ezi omume.+   Unu na-eme ka atụmatụ nke onye nọ n’ahụhụ bụrụ ihe ihere, N’ihi na Jehova bụ ebe mgbaba ya.+   A sị nnọọ na nzọpụta ga-esi na Zayọn bịara Izrel!+ Mgbe Jehova ga-akpọlata ndị ya a dọọrọ n’agha,+ Ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwee obi ụtọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji