Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 139:1-24

Maka onye nduzi. Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ. 139  Jehova, i nyochawo m, ị makwaara m.+   Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m biliri ọtọ.+ Ị na-anọ n’ebe dị anya tụlee ihe m na-eche.+   Ị tụwo ihe niile m na-eme atụ̀, ma mgbe m na-eme njem ma mgbe m na-edina ala,+ Ị makwaara ọbụna ụzọ m niile.+   N’ihi na ọ dịghị okwu dị n’ire m,+ Ma, Jehova, lee! ị marachaala ya.+   Ị nọchibidowo m ihu na azụ; Ị na-atụkwasị m aka gị.   Ihe ọmụma dị otú ahụ karịrị m.+ Ọ dị elu nke na apụghị m ịghọta ya.+   Olee ebe m pụrụ ịga wee gbanahụ mmụọ gị,+ Oleekwa ebe m pụrụ ịgbaga wee pụọ n’ihu gị?+   Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ;+ Ọ bụrụkwa na mụ agbasaa ihe ndina m na Shiol, lee! ị ga-anọ n’ebe ahụ.+   Ọ bụrụ na mụ epuo nku+ nke chi ọbụbọ, Ka m wee biri n’oké osimiri kasị dị anya,+ 10  Aka gị ga na-edukwa m n’ebe ahụ,+ Aka nri gị ga-ejidekwa m.+ 11  Ọ bụrụkwa na mụ asị: “N’ezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ngwa ngwa!”+ Abalị ga-aghọzi ìhè gburugburu m.+ 12  Ọbụna ọchịchịrị agaghị agbara gị oké ọchịchịrị,+ Kama abalị ga na-enwu gbaa dị nnọọ ka ehihie;+ Ọchịchịrị ga-abụkwa ìhè.+ 13  N’ihi na ọ bụ gị mere akụrụ m;+ I kpuchiri m ekpuchi n’ime afọ nne m.+ 14  M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.+ Ọrụ gị dị ebube,+ Dị ka mkpụrụ obi m maara nke ọma.+ 15  E zonahụghị gị ọkpụkpụ m+ Mgbe i mere m na nzuzo,+ Mgbe ị kpara m dị ka ákwà n’ime ime+ ala. 16  Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ,+ E dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị, Bụ́ ụbọchị a kpụrụ ha,+ Mgbe a na-enwebeghị ọbụna otu n’ime ha. 17  Ya mere, lee ka echiche gị si dị oké ọnụ ahịa n’anya m!+ Chineke, lee ka ha si dị ọtụtụ ma a gụkọta ha!+ 18  M sị ka m gụwa ha ọnụ, ha dị ọtụtụ karịa ọbụna ájá.+ Etetawo m, ma mụ na gị ka nọ.+ 19  Chineke, a sị nnọọ na ị ga-egbu onye ajọ omume!+ Mgbe ahụ ọbụna ndị ikpe ọbara mara+ ga-esi n’ebe m nọ pụọ, 20  Ndị na-ekwu okwu banyere gị dị ka echiche ha si dị;+ Ndị iro gị+ ejiriwo aha gị mee ihe efu.+ 21  Jehova, ọ̀ bụ na mụ akpọghị ha asị bụ́ ndị kpọrọ gị asị,+ Ọ̀ bụ na mụ adịghịkwa asọ ndị na-enupụrụ gị isi oyi?+ 22  Akpọrọ m ha asị nke ukwuu.+ Ha aghọworo m nnọọ ndị iro.+ 23  Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m.+ Nyochaa m, marakwa nchegbu m,+ 24  Lee ma m̀ na-eje ije n’ụzọ ọ bụla nke na-eweta ihe mgbu,+ Na-edukwa m n’ụzọ+ nke mgbe ebighị ebi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji