Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 137:1-9

137  N’akụkụ osimiri Babịlọn+—n’ebe ahụ ka anyị nọdụrụ ala.+ Anyị kwakwara ákwá mgbe anyị chetara Zayọn.+   N’elu osisi pọpla+ ndị dị n’ala ahụ Ka anyị konyere ụbọ akwara anyị.+   N’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ndị dọọrọ anyị n’agha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,+ Ndị na-akwa anyị emo gwakwara anyị ka anyị mee ha obi ụtọ, sị:+ “Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ Zayọn.”+   Olee otú anyị ga-esi bụọ abụ Jehova+ N’ala ọzọ?+   Ọ bụrụ na mụ echefuo gị, Jeruselem,+ Ka aka nri m chefuo nkà ya.   Ka ire m rapara n’okpo ọnụ m,+ Ma ọ bụrụ na mụ echetaghị gị,+ Ma ọ bụrụ na mụ emeghị ka Jeruselem dị elu Karịa ihe kasị enye m ọṅụ.+   Jehova, biko, cheta+ ihe ụmụ Idọm+ mere n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị Jeruselem,+ Ha nọ na-asị: “Kwatuo ya! Kwaturuo ya ala!”+   Ada bụ́ Babịlọn, onye a ga-ebukọrọ ihe ya,+ Obi ụtọ ga-adịrị onye ga-akwụ gị ụgwọ+ Mmeso i mesoro anyị.+   Obi ụtọ ga-adịrị onye ga-ejide ụmụ gị Kụrie ha na nkume dị elu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji