Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 136:1-26

136  Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma:+ N’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+   Keleenụ Chi kasị chi niile:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+   Keleenụ Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+   Keleenụ Onye naanị ya na-arụ oké ọrụ ndị dị ebube:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+   Keleenụ Onye ji nghọta kee eluigwe:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+   Keleenụ Onye setịrị ụwa n’elu mmiri:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+   Keleenụ Onye kere ihe ukwu ndị na-enye ìhè:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+   Bụ́ anyanwụ ka ọ na-achị n’ehihie:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+   Ọnwa na kpakpando, ka ha jikọta aka na-achị n’abalị:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 10  Keleenụ Onye gburu ihe niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 11  Onye si n’etiti ha kpọpụta Izrel:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 12  Onye ji aka dị ike na ogwe aka a gbatịrị agbatị kpọpụta ha:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi; 13  Keleenụ Onye kewara Oké Osimiri Uhie:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 14  Onye mekwara ka Izrel si n’etiti ya gafere:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 15  Onye tụbara Fero na ìgwè ndị agha ya n’ime Oké Osimiri Uhie:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 16  Keleenụ Onye mere ka ndị ya jiri ụkwụ gafee ala ịkpa:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 17  Keleenụ Onye meriri ndị eze ukwu:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 18  Onye gbukwara ndị eze ukwu:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 19  Bụ́ Saịhọn eze ndị Amọraịt:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 20  Nakwa Ọg eze Beshan:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 21  Onye weere ala ha nye ndị ya ka ọ bụrụ ihe nketa ha:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 22  Ka ọ bụụrụ Izrel bụ́ ohu ya ihe nketa:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 23  Onye chetara anyị mgbe e wedara anyị ala:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 24  Onye napụtakwara anyị ugboro ugboro n’aka ndị iro anyị:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 25  Onye na-enye anụ ahụ́ niile nri:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi;+ 26  Keleenụ Chineke nke eluigwe:+ N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 136:1*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”