Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 135:1-21

135  Toonụ Jaa!+ Toonụ aha Jehova,+ Nyenụ ya otuto, unu ndị ohu Jehova,+   Unu ndị na-eguzo n’ụlọ Jehova,+ N’ogige ụlọ Chineke anyị.+   Toonụ Jaa, n’ihi na Jehova dị mma.+ Bụkuonụ aha ya abụ olu ụtọ, n’ihi na ọ dị mma.+   N’ihi na Jaa ahọrọwo Jekọb ka ọ bụrụ nke ya,+ Họrọkwa Izrel ka ọ bụrụ ihe onwunwe ya pụrụ iche.+   N’ihi na mụ onwe m maara na Jehova dị ukwuu,+ Onyenwe anyị karịrị chi niile ọzọ.+   Jehova emewo ihe niile masịrị ya+ N’eluigwe na n’ụwa, n’oké osimiri na n’ogbu mmiri niile.+   Ọ na-eme ka alụlụụ si na nsọtụ ụwa na-akwụgo;+ O meworo mmiri ozuzo oghere;+ Ọ na-eme ka ifufe si n’ụlọ nkwakọba ihe ya pụta,+   Onye gburu ihe niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+ Ma mmadụ ma anụmanụ.+   O mere ihe ịrịba ama, rụọkwa ọrụ ebube n’ime gị, gị Ijipt,+ N’ahụ́ Fero na n’ahụ́ ndị niile na-ejere ya ozi;+ 10  Onye bibiri ọtụtụ mba,+ Gbuokwa ndị eze dị ike,+ 11  Ọbụna Saịhọn eze ndị Amọraịt+ Na Ọg eze Beshan,+ Bibiekwa alaeze niile nke Kenan,+ 12  Onye weere ala ha nye ndị ya ka ọ bụrụ ihe nketa ha,+ Ka ọ bụụrụ Izrel bụ́ ndị ya ihe nketa.+ 13  Jehova, aha gị na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Jehova, ihe ncheta gị na-adị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+ 14  N’ihi na Jehova ga-ekpechite ọnụ ndị ya,+ Ọ ga-enwekwa ọmịiko n’ebe ndị ohu ya nọ.+ 15  Arụsị mba niile bụ ọlaọcha na ọlaedo,+ Ọrụ aka mmadụ.+ 16  Ha nwere ọnụ, ma ha apụghị ikwu ihe ọ bụla;+ Ha nwere anya, ma ha apụghị ịhụ ihe ọ bụla;+ 17  Ha nwere ntị, ma ha apụghị ịnụ ihe ọ bụla.+ Ọ dịghịkwa mmụọ dị n’ọnụ ha.+ 18  Ndị na-eme ha ga-adị nnọọ ka ha,+ Ee, onye ọ bụla nke tụkwasịrị ha obi.+ 19  Ụlọ Izrel, gọzienụ Jehova.+ Ụlọ Erọn, gọzienụ Jehova.+ 20  Ụlọ Livaị, gọzienụ Jehova.+ Unu ndị na-atụ egwu Jehova, gọzienụ Jehova.+ 21  Ka e si na Zayọn gọzie Jehova,+ Bụ́ onye bi na Jeruselem.+ Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji