Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 129:1-8

Abụ Nrịgo. 129  “Ha ebusowo m iro ruo ogologo oge malite mgbe m bụ nwata,”+ Ka Izrel kwuo, sị,+   “Ha ebusowo m iro ruo ogologo oge malite mgbe m bụ nwata;+ Ma ha emerighị m.+   Ndị na-akọ ihe n’ubi akọwo ihe n’elu azụ m;+ Ha emewo ka ebe ha kọrọ akọ dịkwuo ogologo.”   Jehova bụ onye ezi omume.+ O gbubisịwo ụdọ ndị ajọ omume.+   Ihere ga-eme ndị niile kpọrọ Zayọn asị,+ Ha ewee gbaghachi azụ.+   Ha ga-adị ka ahịhịa ndụ nke puru n’elu ụlọ,+ Bụ́ nke na-akpọnwụ tupu e fopụ ya,+   Nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị ekpoju aka,+ Onye ọ bụla nke na-achịkọta okporo ọka adịghịkwa ekpoju ya n’obi uwe ya.   Ndị na-agafe agafe adịghịkwa ekwu, sị: “Ka ngọzi Jehova dịrị unu.+ Anyị ejiriwo aha Jehova gọzie unu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji