Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 128:1-6

Abụ Nrịgo. 128  Obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova,+ Onye na-eje ije n’ụzọ ya.+   N’ihi na ị ga-eri ihe aka gị rụpụtara.+ Obi ụtọ ga-adịrị gị, ihe ga-agazikwara gị.+   Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn na-amị mkpụrụ+ N’ime ime ụlọ gị. Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi oliv+ gburugburu tebụl gị.   Lee! Otú ahụ ka a ga-esi gọzie dimkpa+ Nke na-atụ egwu Jehova.+   Jehova ga-esi na Zayọn gọzie gị.+ Hụkwa ọganihu Jeruselem ụbọchị niile nke ndụ gị,+   Hụkwa ụmụ ụmụ gị.+ Ka udo dịrị Izrel.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji