Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 127:1-5

Abụ Nrịgo. Abụ ọma Sọlọmọn. 127  Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ,+ Ọ bụ n’efu ka ndị na-ewu ya na-arụsi ọrụ ike na ya.+ Ọ bụrụ na Jehova echeghị obodo,+ Ọ bụ n’efu ka onye nche na-amụ anya.+   Ọ bụ n’efu ka unu na-ebili n’isi ụtụtụ,+ Na-anọdụ ala n’abalị,+ Na-eri nri n’ihe mgbu.+ Ọ bụ otú a ka o si eme ka onye ọ hụrụ n’anya rahụ ụra.+   Lee! Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova;+ Mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ.+   Dị ka akụ́ nke dị n’aka dike,+ Otú ahụ ka ụmụ a mụrụ n’okorobịa dị.+   Obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke ji ha kpojuo+ akpa akụ́ ya. Ihere agaghị eme ha,+ N’ihi na ha na ndị iro ha ga na-ekwurịta okwu n’ọnụ ụzọ ámá.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji