Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 126:1-6

Abụ Nrịgo. 126  Mgbe Jehova kpọlatara ndị Zayọn a dọọrọ n’agha,+ Ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ.+   Ọchị juru anyị ọnụ n’oge ahụ,+ Mkpu ọṅụ jupụtakwara n’ire anyị.+ Ha wee kwuwe n’etiti mba niile n’oge ahụ, sị:+ “Jehova emewo oké ihe n’ihe o meere ha.”+   Jehova emewo oké ihe n’ihe o meere anyị.+ Anyị na-aṅụrị ọṅụ.+   Jehova, biko, kpọlata ndị ala anyị a dọọrọ n’agha,+ Dị ka ọwa mmiri ndị dị na Negeb.+   Ndị ji anya mmiri na-agha mkpụrụ+ Ga-eji mkpu ọṅụ wee ihe ubi.+   Onye bu akpa nke mkpụrụ ọghịgha juru wee na-aga,+ Ọbụna na-akwa ákwá,+ Aghaghị iji mkpu ọṅụ+ Buru ùkwù ọka* na-alọta.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 126:6*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.