Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 124:1-8

Abụ Nrịgo. Abụ ọma Devid. 124  “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị,”+ Ka Izrel kwuo ugbu a, sị,+   “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị+ Mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,+   Ha gaara eloda anyị ọbụna ná ndụ,+ Mgbe ha na-eweso anyị iwe dị ọkụ.+   Mmiri gaara eburu anyị,+ Iyi gaara asọfe n’elu mkpụrụ obi anyị.+   Mmiri mpako+ Gaara asọfe n’elu mkpụrụ obi anyị.   Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi, bụ́ onye na-ewereghị anyị+ Nye ezé ha ka ọ bụrụ anụ oriri.+   Mkpụrụ obi anyị dị ka nnụnụ Nke si n’ọnyà nke ndị na-esi ọnyà+ fepụ.+ Ọnyà agbajiwo,+ Anyị onwe anyị agbapụwokwa.+   Enyemaka anyị dị n’aha Jehova,+ Onye kere eluigwe na ụwa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji