Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 121:1-8

Abụ Nrịgo. 121  M ga-eleli anya lee ugwu dị iche iche.+ Olee ebe enyemaka m ga-esi bịa?+   Enyemaka m ga-esi n’aka Jehova bịa,+ Bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa.+   E nweghị ka ọ ga-esi kwe ka ụkwụ gị maa jijiji.+ E nweghị ka Onye na-eche gị nche ga-esi roo ụra.+   Lee! Onye na-eche Izrel nche agaghị ero ụra,+ Ọ gaghịkwa arahụ ụra.+   Jehova na-eche gị nche.+ Jehova bụ ndò gị+ n’aka nri gị.+   Anwụ agaghị na-acha gị n’ehihie,+ Ọnwa agaghịkwa na-acha gị n’abalị.+   Jehova ga-eche gị nche ka ọdachi ọ bụla ghara ịdakwasị gị.+ Ọ ga-eche mkpụrụ obi gị nche.+   Jehova ga-eche gị nche mgbe ị na-apụ apụ na mgbe ị na-abata abata,+ Malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji