Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 116:1-19

116  Ịhụnanya juru m obi n’ihi na Jehova na-anụ+ Olu m na arịrịọ m.+   N’ihi na ọ tọworo m ntị n’ala,+ M ga-akpọku ya ụbọchị ndụ m niile.+   Ụdọ ọnwụ gbara m gburugburu,+ Anọ m n’ọnọdụ ọjọọ dị ka à ga-asị na m nọ na Shiol.+ M nọ na-enwe ahụhụ na iru uju.+   Ma m kpọkuru aha Jehova, sị:+ “Biko, Jehova, meere mkpụrụ obi m ụzọ mgbapụ!”+   Jehova na-eme amara, bụrụkwa onye ezi omume;+ Chineke anyị bụkwa Onye na-eme ebere.+   Jehova na-echebe ndị na-amaghị ihe.+ Ike gwụrụ m, o wee zọpụta m.+   Mkpụrụ obi m, laghachi n’ebe izu ike gị,+ N’ihi na Jehova emesowo gị ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.+   Ị napụtawo mkpụrụ obi m n’ọnwụ,+ Napụtakwa anya m n’anya mmiri, napụtakwa ụkwụ m ka ọ ghara ịkpọ n’ihe.+   M ga-eje ije+ n’ihu Jehova n’ala ndị dị ndụ.+ 10  Ekwuru m okwu+ n’ihi na m nwere okwukwe.+ E mekpara m ahụ́ nke ukwuu. 11  Mgbe ụjọ tụwara m, mụ onwe m sịrị:+ “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”+ 12  Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ+ Uru niile ọ na-eme ka m rite?+ 13  M ga-eburu iko nke oké nzọpụta,+ M ga-akpọkukwa aha Jehova.+ 14  M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova,+ Ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile. 15  Ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ Dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.+ 16  Biko, Jehova,+ N’ihi na abụ m ohu gị.+ Abụ m ohu gị, nwa ohu gị nwaanyị.+ Ị tọpụwo agbụ e kere m.+ 17  Ọ bụ gị ka m ga-achụrụ àjà ekele,+ Ọ bụkwa aha Jehova ka m ga-akpọku.+ 18  M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova,+ Ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile,+ 19  N’ogige ụlọ Jehova,+ N’ime gị, Jeruselem.+ Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji