Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 115:1-18

115  Ọ bụghị anyị, Jehova, ọ bụghị anyị,+ Kama ọ bụ aha gị ka ị ga-enye otuto+ Dị ka obiọma* gị si dị, dị ka eziokwu gị si dị.+   Gịnị mere mba dị iche iche ga-eji sị:+ “Olee ebe Chineke ha nọ?”+   Ma Chineke anyị nọ n’eluigwe;+ O mewo ihe niile masịrị ya.+   Arụsị ha bụ ọlaọcha na ọlaedo,+ Ọrụ aka mmadụ.+   Ha nwere ọnụ, ma ha apụghị ikwu okwu;+ Ha nwere anya, ma ha apụghị ịhụ ụzọ;+   Ha nwere ntị, ma ha apụghị ịnụ ihe.+ Ha nwere imi, ma ha apụghị ịnụ ísì.+   Ha nwere aka, ma ha apụghị imetụ ihe aka.+ Ha nwere ụkwụ, ma ha apụghị ịga ije;+ Ha adịghị eji akpịrị ha eme mkpọtụ.+   Ndị na-eme ha ga-adị nnọọ ka ha,+ Ee, ndị niile tụkwasịrị ha obi.+   Izrel, tụkwasịnụ Jehova obi;+ Ọ bụ onye na-enyere ha aka, bụrụkwa ọta ha.+ 10  Ụlọ Erọn, tụkwasịnụ Jehova obi;+ Ọ bụ onye na-enyere ha aka, bụrụkwa ọta ha.+ 11  Unu ndị na-atụ egwu Jehova, tụkwasịnụ Jehova obi;+ Ọ bụ onye na-enyere ha aka, bụrụkwa ọta ha.+ 12  Jehova echetawo anyị; ọ ga-agọzi anyị,+ Ọ ga-agọzi ụlọ Izrel,+ Ọ ga-agọzi ụlọ Erọn.+ 13  Ọ ga-agọzi ndị na-atụ egwu Jehova,+ Ma ndị nta ma ndị ukwu.+ 14  Jehova ga-eme ka unu baa ụba,+ Unu na ụmụ unu.+ 15  Unu bụ ndị Jehova,+ Bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa, gọziri agọzi.+ 16  Eluigwe bụ eluigwe Jehova,+ Ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.+ 17  Ndị nwụrụ anwụ adịghị eto Jaa,+ Onye ọ bụla nke na-agbada n’ebe ịnọ duu adịghịkwa eto ya.+ 18  Ma anyị onwe anyị ga-agọzi Jaa+ Malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi.+ Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 115:1*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”